N45M: 'Not too young too run' abụghị maka ndị ogbenye ọnụ ntụ - Onyeisi APC Imo steeti
BBC Igbo gbara Dan Nwafor bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n'Imo steeti ajụjụ ọnụ maka akwụkwọ ikike ebumnuche iso zọọ ọkwa ọchịchị n’ime APC dịka onyeisiala Naịjirịa ha na-ere nde naira iri anọ n’ise (N45M).
Nwafor gwara onye ntaakụkọ anyị na APC abụghị maka ụmụaka nakwa na ọnyeọbụla nwere ebumnuche ịzọ ọkwa ọchịchị ala na patị ha kwesiri ị gba mbọ hụ na ọ na-eriju afọ tupu oche echiche iso zọọ ọkwa ọbụla n’APC.