Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Praim Mịnista mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na Onyeisi mba Rọshịa bụ Vladimir Putin akaraghị ịwakpo mba Yukren ma ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị.
Johnson si na "mwakpo ara ara" bụ "ezigbote njirịmaatụ igosi odogwu nwoke" na enweghị isi , ma kpọọ oku ka e nwee ohere ụmụnwaanyị ịbanyekwu n'ọkwa ọchịchị."Okwu ya na-abịa dịka ndị ndu mba nọ n'otu Nato na-agbakọ na Madrid ebe okwu gbasara agha Yukren bụ ihe a kpụ n'ọnụ.















