Naira Marley : Ihe i kwesiri ịma maka nwa amadi a

Naira

Ebe foto si, @nairamarley

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọikpe nọrọ n'Abuja ụbọchị Wenezde highariala ikpe onye otiegwu, Azeez Fashola a maara dịka 'Naira Marley', bugaa ya ụbọchị Tọọzde.

A na-ekpe Naira Marley ikpe maka ebubo igwu wayo nakwa izu ohi.

Kemgbe ndị EFCC nwuchikọrọ otiegwu Naira Marley , otu a ka aha ya na egwu o tigara na-ewu ebe nile ọkachasị na soshal midia.

I ji mara nke bụ eziokwu na nke bụ asị, lee anya ka ị mara ihe nile i kwesiri ịma maka Naira Marley.

1. ọ bụ site na aha onye na-eti egwu rege ama ama bụ Bob Marley ka o si dọbiri aha ya ; Naira Marley.

2. Ya bụ nwokoroọbịa na akọwakwa na ọ bụ ya bidoro egwu ọhụrụ a na-akpo " Afrobashment".

3. A mụrụ nwa amadị a na Naịjirịa mana ọ lara mba Briten mgbe ọ dị afọ iri na otu.

4. Egwu mbụ ọ gụrụ nke gosipụtara ya bụ "Marry Juanna" na mba UK.

5. Egwu ya wuru ewu na Naịjirịa bụ "Issa goal" nke ya na Olamide na lil'kesh kụrụ.

6. Ọ baara simi mba na ya akọtọzila ndi na eme "yahoo yahoo", kwuo na ha abụghị ndị ohi.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

7. Ka Naira Marley tichara egwu ọ kpọrọ "Am i a yahoo boy?" nke putara "a bu m onye yahoo?" ka ndị EFCC nwuchiri ma kpochie ya.

8. Ndị nchịkọta nwa okoroọbịa bịara kwuo na ya bụ Naira Marley abughị onye "yahoo yahoo" kwuo kwa na ha na-eme ihe nile i ji kpọpụta ya n'oge na adịghị anya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ndị ga-amasị gị: