Ukraine President: Enwere m ike ịchị Naịjirịa dịka onyeisiala - Basket Mouth

Basket Mouth

Ebe foto si, EPA

Dịka ọ bụ ihe egwuregwu, nwafọ mba Ukaraine na-akpa ndị mmadụ ọchị a kpọrọ Volodymyr Zelensky abụrụla onyeisiala mba ahụ.

Volodymyr Zelensky bụ ọkaiwu dị afọ iri anọ na otu tọgbọrọ asambodo ya wee banye n'ịkpa ọchị, tupu ọ zọọ ọkwa ma merie dịka onyeisiala.

N'aka nke ọzọ Onye ọkpa ọchị ama ama na Naịjirịa bụ Basket Mouth ekwuola na ọ ga-achịnwu Naịjirịa nkeọma ma ọ bụrụ na e nye ya ohere.

O kwuru na ọ ga-emeli nke a maọbụrụ na ewepụ ụfọdụ ihe na-emebi ndọrọdọrọ ọchịchị na Naịjirịa dịka okpukpere chi, ikpa oke na ihe ndị ọzọ.

Basket Mouth mekwara ka anyị ghọta na ndị ọkpa ọchị bụ ndị nwere amamihe ma burukwa ọ dị mma Naịjirịa n'obi.

O kwuru na ha n'elezi anya n'ihe na-aga n'ododo ma were ya mee ihe ọchị dịka ụzọ iji kuziere ndị mmadụ etu obodo anyị siri dewe isi.

O kwuru si n'agbanyeghi aka ọrụ mmadụ, onye ghọtara ihe butere nsogbu Naịjirịa ga-achịnwu Naịjirịa nke ọma.

Basket Mouth, onye ezigbo aha ya bụ Bright Okpocha so n'otu n'ime ndị malitere ịkpa ọchị na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: