Certificate of return: Asambodo 25 anyị napụtara karịchara na nke ndị APC - Inec
Akụkọ dị mkpa:
Inec anarala ndị ụfọdụ asambodo ọchịchị

Ebe foto si, @inecnigeria
Ụlọọrụ Inec ekwuola na ha narakwala asambodo mmeri dị iri abụọ na ise ha nyere ụfọdụ ndị meriri na ntuliaka afọ 2019 site na ntuziaka ụlọikpe nyere ha.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Inec bụ Festus Okoye n'ihe mgbasara ịtụ vootu kwupụtara nke a n'ọgbakọ ha mere n'Enugwu.
Okoye kwuru mmadụ iri abụọ bụ ndị APC anatara ma nye ya ndị APC ọzọ, ebe abụọ ka anatara n'aka ndị PDP ma nyekwa ha ndị PDP ọzọ.
Ebe atọ ndị ọzọ ka e si n'aka APC na PDP ma nye ha ndị pati ọzọ.
Cheta na onye dịka Rochas Okorocha anatabeghi asambodo nke ya n'ihi ebubo na ọ magidere ka akpọpụta mmeri ya n'ike.
Anyị na-enyo Rochas enyo - EFCC

Ebe foto si, Facebook/Rochas
Ọlụọrụ EFCC ekwuola n'ezi ya na ha na-enyocha gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha nakwa ụfọdụ ndị Naịjirịa ọzọ
Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ibrahim Magu kwuru nke mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ na Lọndọn. Mana ọ jụrụ ekwupụta ihe o mere eji enyocha ya.
Ide mmiri amalitela ịkpa ike na Naịjirịa

Oke ịhụ idemmiri amalite ịkpa ike na mpaghara dị ịche ịche na Naịjirịa gụnyere Legọs dịka oke mmiri zoro Steeti ahụ taa.
Cheta na ụlọọrụ gbatagbata bụ NEMA dị mbụ dọọ aka na ntị na Idemmiri nke afọ a ga-apụ iche.
Gịnị na-esere Google na Huawei?

Ebe foto si, Getty Images
Google sị na ọ ga-akwụsị ndị mmadụ n'iji Huawei banye ọgbakọ ha nke ga-eme ka Hauwei tụfuo ọtụtụ ndị ahịa nakwa ego.
Mkpebi a bịara ka onyeisiala mba Amerịka bụ Trump machiri iwu nyere China ikike ibubata ekwenti, nke a o kwuru ga-enyere Amerịka ichekwa 5G netwọk ha.
Mana ụlọọrụ Huawei nke Naịjirịa kwuru na ụlọorụ ha enyela aka iwulite ọnọdụ ekwentị n'ụwa gbaa gburugburu, na ha ga na-eme nke n'agbanyeghi iwu ọbụla.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Mịnịsta mba Iran na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Mohammad Javad Zarif akatọọla ịkwa emo maka ogbugbu ndị mmadụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwara ha.
Zarif gara n'ihu dọọ Trump aka na ntị ka ọ ghara ị na-eyija mba Ịran.]
N'egwuregwu

Ebe foto si, AFP
Ọ dịkwa ka Kylian Mbappe o mepee ụzọ ọpụpụ ya site n'otu egwuregwu Paris Saint-Germain dịka o kwuru na ọ chọrọ ịgba karịa ka o si agba mana onwereike ịbụ n'otu ọzọ.
Otu egwu dịka Real Madrid na ha adọla nwamadị a akpịrị kamgbe.
Nkeji
Ihe nkiri
Ndị gọvanọ Naịjirịa

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Gọvanọ iri atọ n'isii n'okpuru ngalaba Nigeria governors' forum na-akatọ ekike enyere "Nigerian Financial Intelligent Unit" ịnapụ ha nhazị ego okpuruọchịchị steeti ha.
Ha kwuru na atụmaatụ a megidere iwu Naịjirịa ma na-eleda ndị gọvanọ anya.
Onye mgbaza ozi otu ndị gọvanọ bụ Abdulrazaque Bello-Barkindo kwuru na n'akwụkwọ ozi ha degara onyeisiala Muhammadu Buhari, ndị gọvanọ boro NFIU ebubo na ha chọrọ ịnapụ ha ikike ha n'ike.

Ebe foto si, @ihediomaimo
N'ime akwụkwọ ahụ ozi ha degara onyeisiala Buhari, ndị otu NGF gwara onyeisiala ka NFIU chewe ihu n'ịnata ego obodo ezupuru bụ ọrụ ha.
Cheta na NFIU tinyere ọnwa June nke afọ a dịka mgbe ndị isi okpuruọchịchị ga-ebido ị na-eji aka ha adọrọ ego ha mana ya akarịkwana puku narị naira ise kwa ndọpụ.
N'akụkọ ọzọ,

Minista na-ahụ maka mfepụ na mbata ụgbọelu bụ Hadi Sirika egosila afọ ojuju ya maka etu gọọmenti Enugu si eme ihe niile ha nwereike imee iji hụ na ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam nwere ezigbo nchekwa.
Cheta na gọọmenti Enugu mechiri ahịa Orie Emene dị n'akụkụ ọdọ ụgbọelu ahụ igbochi ọdachi.
N'ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Gị na mba Amerịka amakwala aka ọzọ!
Biko onye na-aba mba a
Ọ bụ nna ukwu Amerika bụ Donald Trump na-adọ onyeisiala Iran bụ Hassan Rouhani aka na ntị na-ekwu na Amerịka ga-ala ha n'iyi maọbụrụ na enwe agha pụtara n'etiti ha.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwuregwu Manchester city bụ Pep Guardiola ekwuola na a ga-esite na etu ndị otu egwuregwu ahụ si gbaa bọọlụ na Champions League tulee ha.
O kwuru na nke a bụ n'agbanyeghị na ha mabutere iko atọ n'izu a.











