Inec Certificate of Return: Emeka Ihedioha na Ifeanyi Ugwuanyi anatala asambodo

Ebe foto si, Nora Okafor
Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enwetala asambodo mmeri ịlaghachite dịka gọvanọ steeti ahụ.
Ọ gwara ndị ya na ya so zọ ọchịchị na ya ga-anabata akọ n'uche ha gbasara iwulite steeti Abia.
Ikpeazu kwuru na ya ga-eme ka Abia ka mma karịa ka ọ dị mbụ.

Ọha Enugwu majuru n'ụlọ ọrụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commision (Inec) iso na-emume okike asambodo Bekee kpọrọ "Certificate of Return".
Aka na-achi steeti ahụ bụ Ifeanyị Ugwuanyi sọ na ndị bịara ya bụ njem.
Onye no n'isi oche na ya bụ emụme bụ onyeisi ndị Inec n'Enugwu bụ Emeka Ononammadụ, na mmalite, sị na isiokwu tata bụ ịnye asambodo n'aka ndị ritere ya.
Ọ sị na ya kwere nkwa mgbe ya bidoro ọrụ na ya ga-emepe aka ya na obi ya na-enweghị mmegbu ọbụla.
Ọ sịkwa na ya bụ nkwa abịala na mmezu tata.
Ononammadu sị na ya ga-enyocha ihe niile emere na ya bụ ntuliaka ịmụta n'ihe gara nke ọma ma hapụkwa nke adịghị mma.
Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec na gọọmenti eititi kelere ndị niile nwetere merie ma sị na asambodo a bụ iji kwuo na emechela ntuliaka ma nyekwa ha ikike ịmalite ịgbara ndị wepụtara ha odibo. dịka iwu sị kwuo.
Ọ sị na mmemme bụ mmechi iji gosi na ntuliaka agaala.
Ka ọnatachara asambodo ya, Ugwuanyi gụrụ egwu ekele nye Chukwu.
Ndị nwetere asambodo tata
Okwu chinedu - Aniri
Jane Chinwendu Ene - Agwu North
Chukwuobasi Okwudili - Awgu South
Edward Ubosi - Enugwu East 1
Ugwu Hillary Nkemdili - Enugu East 2
Onoh Marcus - Enugu North
Sam Ngene Okechukwu - Enugwu South 1
Ugwu Mary Onyinye - Enugu South 2
Obienze Chima - Emmanuel Ezeagu
James Okereke - Igboetiti East
Ezeani Ezenta Ugochukwu Igboetiti
Ethel Oyibo Ugwuanyị Igboeze North 1
Innocent Ugwu Emeka Igboeze North 2
Madu Emeka Linus Igboeze South
Ugwueze Chijoke - Nnamani Isiuzo
Val Nnajiofo - Nkanu East
Iroabuchi Desmond - Nkanu West
Nwamba Christain Chinedu Nsukka East
Emma Ugwu Nsukka West
Geofrey Ananyo Mba - Oji River
Ezeugwu Ikechukwu - Udenu
Ugwu Calistus Uche - Udi North
Ene Chukwuka - Udi South
Josephat Emmanuel O - Uzouwani

Ebe foto si, Ihedioha/Twitter

Tata bụ wenezde mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachi bụ ụbọchị akara aka n'Imo steeti maka ịnye ndị meriri na ntuliaka 2019 asambodo ha bụ ike gosiri na ha nwere ikike ịnọchịte anya ndị ọgbọnta vootu ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Emeka Ihedioha na ndị ọzọ Inec kwuru na ha nwere mmeri na ntuliaka emere n'ọnwa Febrụwarị nke afọ a.
Nke a mere na ụlọọrụ Inec nke dị n'Owerri.
Lee ka o si ga ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
BBC ekwuolara Ngozi Obiefule na-anọchite anya ọgbọnta vootu Isu ya na Eddy Obinna bụ onye na-anochite anya ndị Abo Mbaise bụ onye sị na ya ga-eme ka ọgbọnta vootu ahụ bụrụ elụigwe n'ụwa.
Onye osote Gọvanọ bụ Alphonsus Gerald Irona sọkwa n'ime ndị natara asambodo nke ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Egwu dapụrụ ndị na-akwado Ihedioha n'ọnụ mgbe akpọrọ ya.
" ...Ihedioha don come o . I no go gree, I no go gree dey for your hand'
Ọha pụtakwara n'uju mgbe Emeka Ihedioha dapụtara ka ọnatachara asambodo ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 3
O sị na ntuilaka ahụ wepụtere ya bụ nke emere nke ọma.
O kelere Onyeisi ụlọọrụ Inec maka mbọ ọgbara.
O kwụrụ na ọchịchị ha ga a bụ ezigbo ọchịchị bụ nke ga-akwenyere iwu obodo ụgwụ.
Uche Ogbuagụ bụ onye nnọchite anya Ogbonta vootu Ikeduru gwara BBC dịka onye so nata asmbodo n'ụbọchị tata na obi dị ya ụtọ.
Naani ụmụnwaanyị abụọ so na ndị nwetere asambodo tata n'Imo steeti.
Ụfọdụ ndị nwetere asambodo tata
Ejiogu Phillip
Dominic Ezerioha
Nwaneri Reginald
Ekene Fegolis
Iwuanyanwu China
Chimezie Collins
Njoku Michael O.
Uche Ogbuagu
Paul Eleziem











