Rochas Okorocha: Ọ ga-eso ndigbo nwere ike ịbụ 'Senate President'?
Site na mpụtara ntuliaka onyeisiala na nke ndị ụlọomeiwu, ndigbo na-atụ anya na-akpọkwa oku ka e nye ha ohere ka nwa afọ igbo bụrụ onyeisi ụlọomeiwu.
APC nwere ndị Sịnetọ dị iri isii na atọ, PDP nwere ndị Sịnetọ iri atọ na ise ebe YPP nwere naanị otu onye Sịnetọ.
Onye ọkaiwu ma bụụkwa onye ọ nụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọọ ọchịchị bụ Goddy Uwazuruike kọwara na ọ bụ ndị ọnụọgụgụ ha kachasị nwere ikike ịhọpụta onye ga-abụ onyeisi.
O kwuru na ọkwa onyeisi ndị Sịnetọ kwesiri ị bịara Ndigbo mana ndị mpaghara Ugwu nwere ike ha agaghị ekwe ka nke a mee.
O kwuru na "Mgbe Naịjirịa nwere onwe ya, na ọ bụ mkpebi ndị ndu n'oge ahụ ka a na-eke ọchịchị nhatanha.
Mana kemgbe onyeisiala nọ ugbua bụ Muhammadu Buhari banyere o megharịala usoro ndị ahụ".
Uwazuruike kwuru na ọ na-atụ anya na e nwere onye Igbo bụ Sịnetọ n'APC, na ọ ga-enwere ike inwete ọkwa a.

Ụfọdụ Ndigbo a na-atụ anya nwereike ịbụ onyeisi na Sịnetị
Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor kalu
Ọ bụ aka chiburu Abia Steeti afọ asatọ n'aha PDP nakwa PPA bụ nke o hiwere.
Ọ meriri na ntuliaka ọkwa Sịnetọ ga-anọchite anya mpaghara Abia North n'aha pati APC.
Kalu a natala asambodo gosiri na ọ bụ ya meriri na ntuliaka ahụ n'aka ndị Inec nke mere ya onye kachasị enwe ohere inwete ọkwa onyeisi Sịnetị ma ọ bụụ nae nye ya Ndigbo.
Bejamin Uwajimogu

Ebe foto si, Facebook/Benjamin Uwajimogu
Ọ bụ ya na-anọchite anya mpaghara Owerri-North n'ụlọomeiwu Sịnetị n'aha APC.
A mabeghi ma o nwereike imeri na ntuliaka ọkwa Sịnetị e mere dịka ndị Inec kwuru ka e megharịa ya n'ihi ọgbaghara.
Dịka ọ dị ugbua, ọ natabeghị asambodo mmeri n'aka ndị Inec.
Ya mere o tozubeghị oke inweta ọkwa a.
Rochas Okorocha

Rochas bụ gọvanọ na-achị Imo Steeti kemgbe afọ anọ gara aga n'aha APGA nakwa APC.
O ji aha APC zọọ ọkwa Sịnetị ga-anọchite anya mpaghara Owerri West mana onye ọrụ Inec kwuru na Rochas magidere ya ịkpọpụta dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.
Ebubo a bụ nke Rochas gọnarịrị mere ka Inec jụ inye ya asambodo gosiri na o meriri.
N'ihi nke a Okorocha etozubeghi oke inwete ọkwa onyeisi Sịnetị.













