Lagos International Trade Fair: Ụjọ atụla unụ makana gọọmenti etiti achọghị ire ahịa a

Aha onyonyo, Trade Fair: Ọ bụrụgodi na gọọmenti etiti chọrọ ire ọdọ ahịa a, ndị Igbo ga-egonwu ya'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ụtụtụ ụbọchị Monde, Maachị 18, ọnụ ama 'International Trade Fair Complex' nke a maara dịka "Ahịa Aspamda" na-asụ ka mmiri ọkụ dịka ụmụ Igbo nọ n'ahịa ahụ mere ngagharịiwe.

@andybes50484929 setere ihe a ma tinye ya n'akara twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Kepukepu na gọọmenti chọrọ ịnaghara ha ọdọahịa a ma nyefee ya n'aka nna nnukwu ọzọ, na-efegharị.

Ndigbo na-azụ ahịa n' Aspamda na-eme ngagharịiwe

A kpọchiri ọnụ ebe e si abanye ahịa ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ dịka ndị Igbo ahụ jụrụ na ha agaghị ekwe ka nkata gọọmentị etiti na-akpa iji weghara ọdọahịa ahụ nye onye ọzọ, mịta mkpụrụ.

Ndigbo na-azụ ahịa n' Aspamda na-eme ngagharịiwe

N'okwu ya, onye nchikọta ndị ahịa ahụ bụ Tony Obih, kwuru na ihe mere ha ji gbachie ụlọahịa ha n'ụtụtụ a bụ maka kepukepu ha nụrụ na gọọmenti etiti chọrọ iwere ahịa "trade fair" nyefee n'aka ndị

gọọmenti Legọs steeti.

Cheta na gọọmentị etiti gbazinyere ala (lease) maka ahịa n'afọ 1994, ebe a malitere ịrụ ahịa ebe ahụ n'afọ 2000.

Ndigbo na-azụ ahịa n' Aspamda na-eme ngagharịiwe

Ụfọdụ ndị ahịa gwara onye ntaakụkọ BBC na ihe mere maka ọnọdụ Ndigbo kwụ n'etu ha siri tụọ vootu na ntuliaka e mere na nso nso.

Oge BBC Igbo kpọrọ Kọmishọna mgbasaozi nke Legọs steeti bụ Kehinde Bamigbetan iji nụta uche gọọmenti steeti ahụ maka okwu ahụ, o kwuru na ya amaghị maka ya.

Bamigbetan kwuru na ya enweghị ike ikwu banyere okwu ahụ a kpụ n'ọnụ ma ọ bụrụ na imeobi gọọmenti ezukọghị kpaa maka ya.

Akụkọ ga-amasị gị: