2019 elections: Obi adịghị ọtụtụ ndị Igbo mma ka ntụlịaka si gaa
Akụkọ dị mkpa:
Goddy Uwazuruike amaala ọkwa ajọ ihe na Naịjirịa

Ebe foto si, Goddy Uwazuruike/Facebook
Onye bụbu onye ndụ Akaikenga bụ Goddy Uwazuruike arịọla ndị Igbo ka ha mụrụ anya ka azụ n'ọchịchị nke abụọ Onyeisiala Muhammadu Buhari.
Uwazuruike kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịtaụka bụ ebe ọkwenyere na obi adịghị ọtụtụ ndị Igbo mma maka mpụtara ntụlịaka 2019.
PDP nabatara ihe Inec nyochapụtara na Rivers steeti

Ebe foto si, @OfficialPDPNig
Otu PDP anabatala mkpebi INEC gbasara mpụtara ntuliaka nke gọvanọ na nke ndị omeiwu bụ nke emere na Rivers steeti.
Otu ahụ Inec hibere maka isimi n'ala ịmata nke bụ eziokwu na ntụlịaka ahụ kwuru na ha ji ihe agụtara na ntụlịaka nke ndị gọvanọ nakwa nke ndị omeiwu si na ọkpụrụ ọchịchị iri na asaa (17) nke steeti ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, ndị otu ekwe ekwe eji uwe odo odo mara na France esiele ọnwụ ịme ngagharị iwe agbanyeghị na onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron ekwuola na ya agaghịzị ebuli ọnụ mmanụ ụgbọala bụ nke ha jiri malite ya bụ ngagharị iwe kemgbe afọ gara aga.
Mmadụ isii nakwa ndị uweojii dị iri na asaa (17) meruru ahụ na nke ikpeazụ a ha mere.
SC Sfaxien 1 - 0 Rangers

Ebe foto si, Rangers/Twitter
N'egwuruegwu, ndị otu egwu bọọlụ C S Sfaxien nke Tunisia ejirila otu ọkpụ chụla Enugu Rangers na otu B nke Confederation Cup agbara taa n'Enugu.
Gee Nkeji Igbo ebe a
Buhari katọrọ igbu mmadụ na Kaduna
Onyeisiala Muhammadu Buahri akatọọla ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara Kaduna steeti ebe o kwuru sị na ụdịrị ọgụ na mgba a anaghị enwe onye mmeri maọbụ onye e meriri.

Ebe foto si, Getty Images
Buhari kwuru na ọ na-arụ ya afọ na onweghịzị ihe ọ dị ndị mmadụ ka ikwafu ọbara aghara aghara.
Lee ihe o kwuru na Facebook:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Okwu ya na-abịa ka a wakporo ma gbuo ihe karịrị mmadụ iri na steeti ahụ ụnyaahụ.
Ọṅụ ndị Imo o si ebee?
Onyeisi odeakwụkwọ nke Adams Oshiomhole bụ Simon Ebegbulem, ekwuola na ọṅụ ndị mmadụ na-enwe n'Imo steeti ka e mechara ntuliaka ọkwa gọvanọ abụghị maka mmeri Emeka Ihedioha.
Ebegbulam kwuru na obi ụtọ ndị mmadụ bụ makana Gọvanọ Rochas Okorocha na-apụ n'oche ọchịchị ahụ n'ọnwa Mee, 2019.
N'ofesi,
Ndị uweojii mba New Zealand ekwuola na enweghi onye nyerela Brenton Tarrant aka ịkpa arụ n'ụlọụka alakụba abụọ dị n'obodo Christchurch ebe ahụ.

Ebe foto si, Reuters
Tarrant bụ onye a na-enyo maka igbagbu mmadụ iri ise ma merụọ mmadụ iri ise ọzọ ahụ na mwakpo mba ahụ na-ekwu bụ nke kaschasị ọjọọ merela na mba ha.
N'egwuregwu,
Ndị Manchester United ka onye ọbụla kpụ n'ọnụ maka etu ndị Wolverhampton si were goolu abụọ a satara otu gwọọ ha ara ma chụpụ ha n'asọmpi Iko FA.
Gụọ maka ihe mgbu ha n'uju ebe a: Wolves agwọọla Man Utd ara
Ebe ogbo ha bụ Manchester City lara na nta ka ha si na goolu abụọ Swansea jibu na-emeri ha, sachaa ya ma tụkwasị ya otu iji lafere ma banye agba nke ngwụcha-ikpeazụ.
Gụọ maka etu chi Man City si zọọ ha ebe a: Man City egwukpọọla Swansea anya
Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











