Poland: Nwaanyị ejirila ejima 6 mujuo ụlọ

Ebe foto si, AFP/GETTYIMAGES
Nwaanyị dị afọ iri abụọ na itoolu amụọla ejima isii na mba Poland dịka ndị dịbia bekee na ndị ọrụ ahụike nọ na ụlọọgwụ Kakrow si depụta.
Ejima a gụnyere nwa nwoke abụọ na nwa nwaanyị anọ.
Ihe mere ọmụmụ a ji dị iche
- Nke a bụ mgbe mbụ a na-amụ udiri ejima na mba Poland mabụrụkwa ole ole na mbaụwa niile dịka ọkammụta Ryzszard Lauterbach si kwuo.
- A wara nne ha afọ kụpụta ụmụ ejima a
- Onyeisiala zitere nne ha ụkpa ekele aṅụrị
- Ndị dọkịnta kwuru na ihe a bụ ihe iribama
- Otu n'ime afọ ime ijeri ise na-ebute ejima isii kwuru
Dịka dibia bekee si kwuo, nne ejima isii a gbasiri ike ma na-enweri aṅụrị.





