Biafra Remembrance day: Ipob gbara ọgwụ unu ṅụọ na Mee 30 - Uweojii Abia Steeti
Akụkọ dị mkpa
Ndị uweojii Abia adọọla Ipob aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii ngalaba Abia State adọọla ndị Ipob aka na ntị na ha ga-ata onye ọbụla mere ihe nwereike ibute ọgbagharana steeti ahụ
Kọmshịọna ndị uweojii bụ Ene Okon kwuru nke a na nzaghachị iwu Ipob nyere ka ndị otu ya nọọrọ n'ụlọ n'abalị iri atọ nke ọwa Mee.
Mgbe BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna, o kwuru na ndị uweojii adịla njikere ịta onye ọbụla mere ihe n'ụzọ na-ezighi ezi n'ụbọchị ahụ.
Ọ gara n'ihu dọọ ndị nne na nna aka na ntị ka jikọta ụmụ ha n'ụbọchị ahụ n'ihi na ebere agaghị adịrị onye ọbụla aka kpaara.
Ị ga-echeta na ụbọchị iri atọ n'ọnwa bụ ụbọchị otu chọrọ nwereonwe site na Naịjirịa ji echeta ndị otu ha egburu na mpaghara Naịjirịa niile.
Kwụsịnụ ịrụ ụlọahụike aghaghara - Adewole

Ebe foto si, @NGRSenate
Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Isaac Adewole adọọla ndị gọvanọ aka na ntị ka ha hapụ ị na-arụkasị ụlọahụike aghara aghara na-eme ghi ka ndị mịnịstrị ahụike mara.
Adewole sị na ọ bụrụ na emeghị ka ha mara , na ụlọahụike ahụ agaghị arụ ọrụ n'ihi na ọdịghị mfe ịlekọta ụlọahụike.
O kwuru nke a dịka ọ wụchiri n'ụlọomeriwu ịza oku ha kpọrọ ya maka ọnọdụ ọjọ nke ọtụtụ ụlọọrụ ahụike na Naịjirịa.
N'ofesi

Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May agwala ndị ụlọomeiwu ha na ha nwere naanị otu ohere ime ka 'Brexit' nwee isi dịkao wepụtara usoro ọhụrụ.
Ndị ụlọomeiwu ajụla usoro ọpụpụ ndị May wepụtara nke ugboro atọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Henrikh Mkhitaryan nke Arsenal bụ nwafọ Armenia agaghị eso n'asọmpi Ikpeazụ Europa League ha ndị Chelsea ga-agba na mba Azerbaijan
Nke a bụ n'ihi ọgbaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n'etiti mba Azerbeaijan na Armenia.
Nkeji
Ihe nkiri
Ndị uweojii Anambra anwụchiela ndị otu nzuzo

Ebe foto si, Chioma Obianinwa
Na-erughi izu ụka abuo a nwuchiri mmadụ iri itoolu na ise, ndị uweojii nọ n'Anambara steeti anwụchiekwala ndị otu nzuzo iri asaa na ise ọzọ.
Nke a sitere na mbọ ha na-agba ịwepụ mpụ n'Anambara steeti, site n'ụzọ a kpọrọ "Operation Puff Adder" n'olu bekee.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambra steeti bu Haruna Mohammed gwara BBC na ha na ụmụaka iri na otu na-etorubeghị ikpụga ụlọ mkpọrọ so na ndị ha nwuchiri.
Ọ na-ekwukwa si na ha naputara ndị otu nzuzo a egbe atọ, otu akpa ihe yiri igbo di n'ime ya, Bereti atọ ma chọputa kwa ebe zoro ezo ha na agba ọgwu ike.

Ebe foto si, @HQNigerianarmy
Gbanụ mbọ buso mpụ agha na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ na ndịda anyanwụ ebe ezigara ụnụ.
Onye na-ekwu?
Ọ bụ onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nke Mohammed Mohammed nọchitere anya na ọgbakọ nkuzi ndị agha na-enye ndị agha Naịjirịa bi na mpaghara ndị ahụ ndụmọdụ
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe nọ na mba France enyela iwu ka amalitekwa ọzọ iji Igwe bekee kwado ndụ Vincent Lambert nọ n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma kamgbe afọ 2008 o nwere mberede okporoụzọ.
Akwụsịwala ya bụ nkwado n'ụbọchị monde gara aga mgbe mkpebi ụlọikpe a biara.

Ebe foto si, Getty Images
Vincent ọzọ na-akpakwa ike n'Egwuregwu.
O kwuru na ọ na-apụ na otu egwuregwu Manchester city ka ọ ga abụrụ onyeisi na otu egwuregwu Anderlecht.











