Ụka Anglịkan: Kwụsị njem ahụike

Primate Nicholas Okoh akatola agwa ndị gọọmenti nakwa ndị nkịtị ji agbaga obodo oyibo iga nara ọgwụgwọ n' ụlọ ọgwụ ha.
Ọ gwara ndị ọchịchị gọọmenti na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gbakọrọ ụka olili ozu onye jibụ ọkwa osote onyeisi ala n'oge gara aga bụ Alex Ekwueme.
Ọ tụrụ arịrị na ụlọọgwụ dị na Naijiria erijughị afọ, ebe obodo dịka India na Dubai na-ekpokọ nde kwuru nde naira n' aka ndị ala anyị were na- emepe obodo ha.
Pia aka ebe ha ị nụrụ ihe ọkwuru na uju:
N'otu olu ahụ, Achịbishọp ụka Anglịkan nke Enugwu Eklesiastịkal Prọvinsị bụ Emmanuel Chukwuma katọrọ obubu gọọmenti buru Alex Ekwueme gaba obodo oyibo maka nleta tupu ọ nwụọ.
Chukwuma onye kwuru okwu chukwu n' Okpara Square dị n'Enugwu gwara gọọmenti ka ha kwụsị iga ala bekee maka ọgwụgwọ ọrịa onwe ha ebe ndị mmadụ na-atakuta ihe aja na Naijiria.






