Nwaanyị amụọla ejima anọ n'ogbe ndị gbara ọsọ ize ndụ

Akụkọ ndị dị mkpa:

Nwaanyị amụọla ejima anọ na Zamfara

Ejima anọ

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwaanyị amụọla ejima anọ n'ogbe ndị gbara ọsọ ize ndụ na Zamfara steeti.

Nna ụmụaka ahụ gwara ndị ntaakụkọ na nwunye ya amụbuola ụmụ asaa nke gụnyere ejima abụọ tupu ọ mụọ ndị a.

Ha nọ n'ụlọọgwụ n'isi obodo Zamfara bụ Gusau ugbua.

N'otu aka ahụ

Soldiers

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọtutụ afọ agaala ndị agha ala Naijịrịa na-aluso ndị Boko Haram ọgụ

Mkpa mkpa kpara n'obodo Mailari eriela isi mmadu iri n'itoolu na Borno steeti mgbe ndị Boko Haram wakporo ime obodo ahụ

Mana otu onye ọrụ gbata gbata achọghị ka enye aha ya na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ruru iri isii na atọ.

Na mba ofesi

Ndị nọ n'ime ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ gbata-gbata azọpụtala ndụ ihe ruru mmadụ puku iri abụọ na abụọ n'ide mmiri na steeti Kerala n'India.

E chere na ihe ruru puku mmadụ ole na ole ka tọrọ atọ ebe ahụ dịka ide mmiri ahụ na-ebelata nwayọ nwayọ.

N'Egwuregwu

Amaju Pinnick na Gianni nfantino, onyeisi FIFA

Ebe foto si, Getty Images

Taa bụ ụbọchị ikpeazụ FIFA nyere ngalaba na-ahụ maka bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF iji tighachi onye bụbu onyeisi ha bụ Amaju Pinnick.

Fifa kwuru na-ewepu nke a, na ha ga-amachi Naịjirịa niike maka ị da iwu.

Ihe nkiri ụtụtụ a

Aha onyonyo, Ọkụ ogene