Patience Jonathan: Ụlọikpe anakọrọla nwunye onyye bụbụ onyeisiala ego EFCC sị na o zupuru

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe ukwu dị na Steeti Legọs enyela iwu ka gọọmentị Naijiria weghara ego dị nde dollar asatọ na ụma nakwa ijeri naira itoolu na ụma bụ nke a sị na Patience Jonathan zupuru oge di ya bụ Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.
Ọkaikpe Mojisola Olaterogun nyere iwu a n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jụlaị bụ Monde wee kwuo na Patience enyeghi nkọwa zuru oke etu o si nweta ego ndị ahụ.
Cheta na ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' gbara Patience Jonathan akwụkwọ n'ihi ebubo nrụrụaka.
Ndị EFCC kwuru na Patience zupuru ego buru nnukwu ibu oge di ya bụ onyeisiala ma were ego ndị ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ nakwa ala.
Ha rịọrọ ọkaikpe ka o nye iwu ka eweghachiri gọọmentị ego, ụlọ na ala ndị ahụ Patience ji ego o zupuru wee zụọ.
Akụkọ ga-amasị gi:





