Nigerian Embassy : 'Nne Leah Sharibu bụ ọnye asi'

Ebe foto si, Getty Images
Nnọchiteanya Naijirịa na USA apụtala katọọ ọgbakọ ndị a na-akpọ 'The Heritage Foundation' nke Amerika mere maka igba ama nke ha kpọrọ " Enweghị Nchekwa na Naịjirịa: Okwu ndị akaebe"
Ndị a kpọrọ bịa mee mkpesa a bu Rebecca Shaibu ( Nne Leah Shaibu), Alheri Bawa Magaji na Napoleon Adamu.
Nnọchịta anya Naijiria na USA kwuru na ndị biara gbaa ama n'ọgbakọ ahu juputara na asị ma bụrụ kwa ndị nwere obi ọjọọ ebe gọọmentị Naijirịa nọ.

Ebe foto si, Reuters
Ha na-ekwukwa na mgbe ọzọ ka ndị otu 'The Heritage Foundation' gbalịa mee ka ndị gọọmentị Naịjirịa soro n'ọgbakọ a ka ha nwere ike zara isi onwe ha.
Chetakwa na Leah Sharibu soro na ụmụaka akwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ ma ha ekweghi ihapu ya mbge ha hapụrụ ndị ọzọ n'ihi na Leah ekweghị ịhapụ okwukwe ya dịka onye nke Kraịst.





