Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti etiti agọnarịla akụkọ Ahmed Salkida wepụtara nke kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na ise n'ime ụmụakwụkwọ Chibok otu narị na iri na abụọ eji eji ka dị ndụ
Onye ndụmaọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Malam Garba Shehu kwupụtara nke sị na aka Ahmed Salkida adịghị na mkparịta ụka ịtohapụ ụmụaka ndịa.
Nwaanyị zutere ọnwụya n'akwamozu ọ gara n'Enugwu Steeti

Ebe foto si, Ebere Amaraizu
Ihe mgbawa obi emela mgbe onye bịara ịkwa ozu soro ozu laa mụọ. Otu nwanyị akpọrọ Ngozi Eze zutere ọnwụya dịka otu nwoke otu nwoke bụ Daniel Chukwu jiri egbe gbagbuo ya n'amaghị ama.
Nke a mere na Amanato mburumbu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Donald Trump adọọla Gọọmentị mba Sirịa aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla ndị gọọmenti Sirịa aka na ntị na ha ndị na njikere ịtụ ogbunigwe ọzọ ma ọ bụrụ na o sepụghi aka n'iji ngwaagha kemịkal awakpo ndị mmadụ.
Ebe gọọmenti mba Sirịa ekwuola na aka ha adịghị na ngwaagha Kemịkal na ọ bụ ndị agha nnupiisi boro ha ebubo ime mwakpo ahụ.
N'egwuregwu

Ohere irite ọlaedo n'ịgba ọsọ ikeagwụnwamkpị n'egwuregwu Commonwealth akwala otu nwoke bụ Callum Hawkins nwafọ Scotland.
Hawkins dara n'ala ugboro abụọ dịka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka o merie n'ọsọ ahụ nke mere onye ọzọ jiri rite ọlaedo ahụ.
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe nkiri nke taa
N'ihe nkiri a, Sịnetọ Enyinnaya nke Abia Steeti kwuru na ndị ọchị ehi chọrọ ị napụ ụmụ afọ Naịjirịa ala ha n'ike











