BBNaija2019: Lee ihe ndị Igbo na-eme emume a bụbụ tupu ha esonye

Ebe foto si, @thelmaibemere/@mercybbn_4
Aha akpọrọ Big Brother Naija nke 2019 bụ "Pepper Dem" mana ọ ga-adị mma ka anyị mata ndị ọ bụ ha ga-agba onwe ha ose n'emume a.
Ndị ntoroọbịa 21 sọ na-eme emume a. Mmadụ isii n'ime ha bụ ndị Igbo.
Lee ihe ndị a na-arụ tupu ha esonye n'emume "Big Brother" a.
Victoria "Ella" Nnabuchi

Ebe foto si, BBnaija Website
Nwada Igbo a bụ onye na-ekwu okwu n'onyonyo, na-emekwa ihe nkiri nakwa iyipụta uwe nke ndị Bekee kpọrọ "model".
O kwenyere n'inwe okwukwe n'ihe ị na-achọ ruo mgbe ọ biara na mmezu.
Chemeka Frodd Okoye

Ebe foto si, @jeffbbnaija
Nwa amadị a si Anambra steeti bụ onye na-enye ndụmọdụ gbasara iji ego achụ ego.
Ọ dị afọ iri abụọ na asatọ.
Ọ chọrọ ji ego o ga-erite na ya bụ emume ma o merie wee kwụọ ụgwọ nne ya na-akwado iwa ahụ, ma mepe ọrụ akwụ ụgwọ ga-enyere ndị nne na-enweghị di aka.
Steve Ikechukwu Onyema

Ebe foto si, @official_ike_onyema
Onyema bụ nwafọ Imo steeti dị afọ iri abụọ na isii (26).
Ọ bụ onye ji ego achụ ego mana o nwere ọdachị n'azụmahịa nke mere ka ọ lakwuru ọyị ya nwaanyị ga biri be ya mgbe ahụ.
O kwuru na ọ ga-achọrọ nwanne ya nwoke ya na ya bi ego ma o merie BBNajia2019.
Jeff

Ebe foto si, @jeffbbnaija
Jeff bi na Jos mana o si na steeti Anambra.
Ọ dị afọ iri atọ ma na-arụ ọrụ n'ụlọakụ.
O kwuru na ọ ga-eji ego o nwetere na BBNaijia chụọ ego.
Thelma Ibemere

Ebe foto si, @thelmaibemere
Nwada a depụtara aha Igbo ya dịka Thelma Ibemere nke mere ka anyị che na ọ bụ onye Igbo.
Ọ dị afọ iri abụọ na isii.
O ekwenyere na ịyị ndị ga-ewepụta ihe dị mma n'ime gị.
Mercy Eke

Ebe foto si, @mercybbn_4
Nwada a dị afọ iri abụọ na isii bụ onye Imo steeti.
Ọ na-agbara ndị na-etiegwu n'ihe nkiri.
Ọ kwuru na ndị na-eme mpako a naghị amasị ya.
Emume Big Brother Naija 2019 nke a kpọrọ BBNaija n'aha ịchafụ ga-ebiri ọkụ taa bụ abalị iri atọ nke ọnwa June 2019.
Ọ bu emume a na-egosi na ihe onyoonyoo televishọn ebe ụfọdụ ndị ntorobịa ga-anọ n'ime otu ụlọ ruo abali iri itoolu.
Ndị ntorobịa ndị a ga na-asọ mpi na ihe dị iche iche ebe a ga na-achụpụ ndị emeghị ọfụma n'otu n'otu ruo mgbe otu onye ga-emeri.
Onye ga-eturu ugo n'ikpeazụ ga-erite ego na ihe onyinye ruru nde naịra iri isii (N60 million).

Ebe foto si, Bigbronaija Instagram
Nwaafọ Igbo bụ Miracle Igbokwe ka etubere ugo na ihe emume BBNaija nke afọ 2018.
Igbokwe ritere ego na ihe onyinye ndị ọzọ ruru nde naira iri anọ na ise (N45 million).
Ka ọ dị ugbua, amatabeghị ndị a ga ahọpụta isonye na emume nke afọ a.
Ọtụtụ ndị ntorobia Naijiria etinyewela ọnụ na soshal midia maka mmalite ya bu BBNaija 2019.
Mana ọtụtụ na-akatọkwa ya bụ egwuregwu na-ekwu na onweghi ihe nwere isi ọ na-akụziri ndị na-eto eto.
Akụkọ ga-amasị gị:










