Ecowas Summit: Issoufou Mahamadou bụzị onyeisi ọgbakọ a

Ebe foto si, Twitter/@BashirAhmad
Onyeisiala mba Niger Republik bụ Issoufou Mahamadou abụrụla onyeisi ọgbakọ jikọrọ mba nile dị n'ọdida anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas.
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari hafere Mahamadou ọchịchị n'ọgbakọ Ecowas nke iri ise na ise nke e mere na Abuja ụbọchị Satọdee.
A nọkwara n'ọgbakọ ahụ cheta ma tube dibia Bekee Ameyo Adadevoh nakwa Kofi Annan ugo.
Adadevoh bụ dọkịta nyere aka gbochie mgbasa ọrịa Ebola na Naijiria, ebe Annan bụ aka chiburu ọgbakọ mba uwa a kpọrọ United Nations.
Cheta na Buhari nọkwa n'ọgbakọ ahụ kwuo na ndị isiala mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ga-emepụtarịrị otu atụmatụ iji buso nsogbu nchekwa agha na mpaghara ahụ.
O kwuru nke a na nzụkọ iri ise n'ise nke ọgbakọ Ecowas na Abuja n'ụbọchị satọde.
Ndị otu Ecowas kpebikwara na mba ọdịda anyanwụ Afrịka ga na-ejizi otu ụdị ego a kpọrọ 'Eco' were azụkọrịta ahịa.

Ebe foto si, NPF/Whatsapp
Aka ndị uweojii akpara otu nwata nwaanyị dị afọ iri abụọ nke akụkọ kwuru sugburu dị ya na Nsugbe.
Ndị uweojii kwuru na nke a mere dịka nwaanyị ahụ na di ya na-ese okwu ma na-alụkwa ọgụ.
E nyere aha nwaanyị ahụ dịka Makudochukwu ebe aha nwoke ahụ bụ John Bosko Ngu.
Akụkọ kwukwara na agbalịrị buga nwoke ahụ ụlọọgwụ mana azọtaghị ndụ ya.
Ihe mere na AFCON taa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mba Kamerun na Gana gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere onwe ha taa.
Onwekweghi onye nyere goolu ọbụla nke fọrọ ibe ya ịsata ya bụ goolu.
Cheta na Super Eagles Naịjirịa ga-ezute Madagaska n'ụbọchị ụka.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service
Gọọmentị Naịjirịa adọọla ndị na-eme njem na mba Itiopia aka na ntị sị ha ejila ego gafere puku dọlla atọ bata n'obodo ahụ.
Ha kwuru na mba Itiopia ga-ejichi ego ọbụla karịrị nke a n'Iwu ọhụrụ mba abụọ a weputara iji buso agha megide nrụrụaka ego.
N'egwuregwu,

Osote onye ndu otu Super Eagles bụ Ahmed Musa ekwuola na ngalaba NFF ka ji ha ụgwọ asọmpị ha gbara agba.
O kwuru nke a n'ọgbakọ super Eagles na ndị ntaakụkọ nwere n'obodo Alezandrịa n'Ijipt.










