Chief of Army Staff burial: Etu e si lie Ọchịagha Attahiru Ibrahim na ndị ọzọ nwụrụ na mberede ụgbọelu

Olili onyeisi ndịagha ndị ọzọ nwụrụ na mberede ụgbọelu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

E liela ozu Ọchịagha Naịjirịa bụ Attahiru Ibrahim na mmdụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ebe a na-eli ndịagha dị n'Abuja.

E buuru ozu Ọchịagha Ibrahim na ndị ọzọ n'ekpere alakụba gaa n'ụlọ alakụba nakwa ụlọụka dị n'Abuja maka akwamozu ha tupu e buru ha lie.

Onyeisi agha a na mmadụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Kaduna n'ụbọchị Fraịde.

E fere ụka akwamozu ndị nke kraịst n'ụlọụka Protestant dị n'Abuja ebe ndị alakụba bụ n'ụlọakakụba dịkwa n'Abuja.

Nwunye ọchịagha Naịjirịa na ndị ọzọ so ya nwụọ

Ndịagha nabatara ozu ndịisi ha nwụrụ anwụ n'ụlọụka nakwa n'ụlọalakụba ebe ezinaụlọ n'ọkwa n'ebe ahụ.

Lee mgbe a ga-eli Ọchịagha Attahiru Ibrahim na mmadụ isii n'ime ndị nwụrụ na mberede ụgbọelu

Major General I Attahiru

Ebe foto si, BashirAhmad/Twitter

Nkọwa foto, Ọchịagha I Attahiru bụ onye ji ọkwa 'Chief of Army Staff'

Taa bụ Satọde, ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee 2021, ka a ga-eli Ọchịagha Attahiru Ibrahim na mmadụ isii ndị welitere isi nwụrụ na mberede ụgbọelu.

N'ozi si n'aka ndịagha Naịjiria, ha kwuru na a ga-eme ekpere akwamozu Attahiru na mmadụ isii ndị ọzọ welitere isi n'ụlọụka National Christian Centre nakwa ụlọAlakụba National Mosque dị n'Abuja.

Ozi ahụ kwuru na ekpere a ga-amalite ebe elekere iri nke ụtụtụ, tupu e lie ozu ha mgbe o ji nkeji iri atọ gafee elekere iri na abụọ (12:30) nke ehihie Satọde.

A ga-eli ha n'ebe a na-eli ndịagha bụ National Military Cemetery nke dị n'Abuja.

Lee aha ndị so Ọchịagha Ibrahim Attahiru nwụọ na ihe Onyeisiala Buhari kwuru

Buhari

Ebe foto si, Twitter/MBuhari

Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari akwaala arịrị maka ọnwụ Ọchịagha Ibrahim Attahiru na mmadụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ụnyaahụ.

Buhari kwuru na mmadụ niile ahụ nwụrụ na ya bụ ihe mberede bụcha dike ndị "kwụrụ ụgwọ kacha ụgwọ ka udo na nchekwa wee dị n'obodo".

Ọ gakwara n'ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ nakwa ndị agha na ndị Naịjiria aka n'obi, wee sị na ihe mberede a kacha egbu mgbu n'obi dịka o mere mgbe ndị agha na-akwado ịkwụsị ọnọdụ ọjọọ gbasara nchekwa Naịjiria nọ n'ime ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Buhari nabatakwara ndị isi nchekwa Naịjiria mgbe ha wetere ya ozi ọnwụ Attahiru.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Lee aha ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ahụ:

  • Brig. Gen M. I Abdulkadir
  • Brig. Gen Olayinka
  • Brig. Gen Kuliya
  • Maj. L. A Hayat
  • Maj. Hamza
  • Sgt. Umar
  • Flt. Lt. T. O Asanyi
  • Flt. Lt A. A Olufade
  • Sgt. Adesina
  • ACM Oyedepo
Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mara na Ọchịagha Attahiru ka werela ọchịchị dịka onyeisi n'ọnwa Jenụwarị na mmadụ iri ndị a si Abuja na-aga njem ọrụ na Kaduna mgbe ụgbọelu ha kpọkasịrị na Kaduna n'ihi 'ajọ ọnọdụ ihu igwe' dịka ndị agha si kwuo.

Ọ rụrụ ọrụ na 82 division ndị agha dị n'Enugwu steeti site n'afọ 2015 ruo 2016 tupu e ziga ya ka ọ bụrụ onyeisi ndị na-ebuso Boko Haram agha n'afọ 2017.

Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno steeti, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'.

Ọ bụ oge Attahiru na-achịkọta ngalaba a ka Boko Haram kpara ọtụtụ mkpamkpa ha kpara n'afọ 2017.

N'ọnwa Disemba afọ 2017, e wepụrụ Attahiru dịka onyeisi 'Operation Lafiya Dole' ma zighachi ya n'isi ụlọọrụ ndị agha dị n'Abuja.

Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka ihe mberede a:

Atiku Abubakar bụbu osoye Onyeisiala Naịjiria ma zọkwaa ọkwa onyeisiala kwuru sị na chi ji ehihie jie n'ihi ọnwụ ndị a.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ahmed Lawan bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu kwuru na ọ bụ ihe mwute.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Nasir el-Rufai bụ gọvanọ Kaduna steeti bụ ebe ya bụ ihe mberede mere, tiri ezinaụlọ ndị ihe mberede a metụtara aka n'obi.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Oby Ezekwesili bụbu minista agụmakwụkwọ kwuputekwara mwute ya

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7