Chief of Army staff: Etu Major General Attahiru Ibrahim si nọchie Buratai chụrụ ya n'afọ 2017

Ebe foto si, AFP
Ị ma na Ibrahim Attahiru bụ onyeisi ndịagha Naịjiria a ka nyere ọkwa a nọchiri onye chụrụ ya n'afọ 2017?
Tukur Buratai bụ onyeisi ndịagha nke pụrụ apụ, wepụrụ Attahiru n'ọkwa dịka onye ndu ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha n'ọnwa Disemba 2017.
N'agbanyeghi na ha ekwughi ihe mere e ji wepụ Attahiru n'ọkwa mgbe ahụ, mwepụ ya butere ọtụtụ mwakpo ndị mmadụ n'aka ndị Boko Haram, nke gụnyere ogbugbu ihe ruru mmadụ 50 n'ime otu ụlọalakụba n'ọnwa Nọvemba nke afọ ahụ.
Mara na nke a bịara ka ụbọchị 40 Buratai nyere ya iji hụ na ọ nwụchiri Abubakar Shekau bụ onyeisi Boko Haram n'ọnwụ maọbụ ndụ, gachara n'ọnwa Julaị 2017 ahụ.
Kama inwụchi Shekau n'ọnwa ahụ, ihe ruru mmadụ 40 nwụrụ n'ime otu ọgụ ndịagha gara ịzọpụta ndị mmadụ ndị omekome a wakporo n'ọtụtụ ụgbọala na-agakọ ọnụ.
Ndị nwụrụ na mwakpo ahụ gụnyere ndị uweojii na ụfọdụ ndị ụlọọrụ na-achọpụta mmanụ agbịdị.
Attahiru nọbu n'isi ndị du agha ibibi Boko Haram ebe ha na-akpa mkpamkpa na mpaghara Nọt-Ist n'ọnwa Mee n'afọ ahụ.
E mechara were General Nicholas Rogers du ndị agha pụrụ iche na ụfọdụ ndị uweojii ịkwụsị ọgụ dị n'etiti agbụrụ na mpaghara ahụ, tichie Attahiru.
Ihe ndị ị kwesiri ịma maka ndị isi nchekwa ọhụrụ Naịjiria

Ebe foto si, Twitter/Mbuhari
Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka onyeisiala Naịjirịa bu Muhammadu Buhari gbanwere ndị isi nchekwa.
O kwuputara n'akara Twitter ya na ọ nabatara akwụkwọ nkwụsị ọrụ ha ma kelee ha maka aja niile ha chụụrụ ndị Naịjirịa n'ọrụ ha.
N'otu aka ahụ, o wepụtakwara aha ndị ga-anọchi anya ndị na-apụpụ n'ọrụ nchekwa obodo.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Nke a na-abịa adịka ndị mmadụ na-akatọ ndị agha maka omume ha n'Orlu, Imo steeti.
Aha ndị ọhụrụ na-abata bụ:

Ebe foto si, BashirAhmad/Twitter
Ọchịagha Ibrahim Attahiru
Nọchiri anya Tukur Buratai dịka 'Chief of Army Staff'
Attahiru jiri ọkwa dị iche iche n'otu ndị agha Naịjirịa.
Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno State, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'.
Ọ bụ oge Attahiru na-achịkọta ngalaba a ka Boko Haram kpara ọtụtụ mkpamkpa ha kpara n'afọ 2017.
Otu n'ime ha bụ oge ndị Boko Haram wakporo ndị ụlọọrụ NNPC gara njem ịchọpụta mmanụ agbịdị na mpaghara 'Lake Chad'.
Ndị agha iri na abụọ tufuru ndụ ha na mwakpo ahụ, ebe ndị Boko Hara tọọrọ ụfọdụ ndị nkuzi Mahadum 'University of Maiduguri' so wee mee njem ahụ.
N'ọnwa Disemba afọ 2017, e wepuru Attahiru dịka onyeisi 'Operation Lafiya Dole' ma zighachi ya n'isi ụlọọrụ ndị agha dị n'Abuja.

Ebe foto si, Nigerian Army
Ọchịagha Lucky Leo Irabor
Nọchiri anya Gabriel Olonisakin dịka Chief of Defence Staff.
Irabor rụkwara ọrụ ọtụtụ afọ dịka onyeisi operation lafiya dole.
Ọ bụ Irabor hafere ọchịchị ngalaba ahụ n'aka Attahiru n'ọnwa May afọ 2017.
Irabor mechara rụọ ọrụ dịka onyeisi ngalaba ndị agha na-ahụ maka ọzụzụ nke a kpọrọ 'training and operations' na bekee.
Ọchịagha mmiri A.Z. Gambo
Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba mgbasaozi nke ndị agha mmiri Naịjirịa
Ọ nọchiri anya Ibok Ete-Ibas dịka onye isi ndị agha mmiri.
Ọ bụ n'afọ 2016 ka e si n'ọkwa Commodore bulie Gambo n'ọkwa Rear Admiral.

Ebe foto si, Nigeria Airforce
Ọchịagha Isiaka Oladayo Amao
Ọ bụ onye nọchiri anya Sadique Abubakar dịka onyeisi ndịagha ụgbọelu Naịjirịa.
Ọ banyere n'otu ndịagha n'afọ 1984, ma jikwaa ọkwa dị icheiche n'isi ụlọọrụ ndị agha ụgbọelu dị n'Abuja.









