Promotions in the Nigerian Army: Buhari ebuliela Adeosun, Biu n'ọkwa
Akụkọ dị mkpa:
Buhari ebuliela Adeosun n'ogogo ọkwa Buratai

Ebe foto si, Nigerian Army
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammudu Buhari ebuliela onyeisi ọzụzụ ndị agha bụ Major General Lamidi Adeosun, n'ọkwa 'Lieutenant General' ebe o buliri onyeisi atụmatụ LAFIYA DOLE Maiduguri bụ Brigadier General AB Biu rue n'ọkwa Major General.
Onyeisila Buhari kwuru n'ozi ekele o ziburu na ọ bụ iji gosi nkwado nye ọrụ ndịagha na-arụ n'ihe gbasara nchekwa Najiria.
O bulikwara Lieutenant AJ Danjibrin nke '211 Demonstration Battalion' dị na Bauchi. n'ọkwa 'Captain.'
Onyeisi ndịagha bụ Tukur Buratai kelere ha n'aha Ndịagha Naijiria ma kpere ha ekpere ihe ọma n'ọrụ ha n'ọdịnihu.
Mana ozi a akpaliteela okwu na Buhari ndọrịtaụka na Buhari ewepụla Buratai n'ọkwa ya dịka ọkwa ọhụrụ e nyere Adeosun nọ n'otu ogogo nke Buratai.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana onye nnyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara soshal midia bụ Bashir Ahmad kwuru na Adeosu ịbanye n' ogogo nke Buratai nọ na ya abụghị apụtaghị na a chụọla Buratai dịka onyeisi ndịagha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ndị uweojii na otu Shiite akwataala n'ụlọomeiwu dị n'Abuja.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na ndị otu Shiite a kpọrọ Islamic Movement of Nigeria na Bekee kwatara n'ụlọomeiwu dị n'Abuja mgbe ndị a wakporo ụlọomeiwu a.
Ndị uweojii kwuru na e merụrụ ndị otu ha ahụ mana ndị Shiite kwuru na ha na-eme ngagharịiwe maka onyeisi bụ Sheik Ibrahim Elzakzaky akpọchiri kamgbe afọ 2015.
Mana ha gọọrọ na onweghi ndị uweojii ọbụla ha merụrụ ma ọ bụ ụgbọala ha mebiri.
Ha emeela ụdị nghagharịiwe a na mbụ bụ nke butere ọgbaghara na ịkwafu ọbara.
Buhari ọ gụrụ akwụkwọ ka ọ bụ na ọ gụghị?

Ebe foto si, @MBuhari
Okwu Onyeisiala Muhammadu Buhari ọ gụrụ akwụkwọ ka ọ bụ na ọ gụghị bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'ikpe onye meriri na ntuliaka onyeisiala e kpere taa bụ Tuuzde.
A dọrịtakwara na Buhari ọ maara asụ Bekee ka ọ bụ na ọ maghị?
Ọkaiwu na-anọchite Buhari bụ Wole Olanipekun, ekweghị ka a nabata akwụkwọ na-egosi ihe Buhari bụ iji maatụ ụlọakwụkwọ ọ gụrụ dịka o siri nye Inec.
Ajụjụ ndị ọkaiwu na-anọchite Buhari na APC jụkwara ndị akaebe Atiku kpọrọ gbadokwara ụkwụ na onyeisiala ọ ma-asụ Bekee.
Cheta na n'ime akwụkwọ ọ gbara, Atiku na-ekwu na Buhari enweghị asambodo sekọndịrị bụ ihe onye na-azọ ọkwa onyeisiala kwesịrị inwe.
Ha jụrụ onye rụrụ ọrụ dịka 'collation agent' PDP na Niger steeti bụ Tanko Beche nakwa onyeisioche PDP na Katsina na Buhari ama asụ Bekee, ma ha ahụtụla ebe Buhari ji Bekee agwa ndị mmadụ okwu oge ọ chri dịka onyeisiala n'oge ọchịchị ya dịka onye agha..
Ha sara na ha amaghị.
Maijigiri kwuru na ya amaghị n'ihi na ya bụ nwata nọ n'ime obodo oge ahụ.
Gọọmentị etinyela ọnụ n'ọnwụ Ndubuisi Chukwu.

Ebe foto si, Facebook/Chartered Insurance Institute of Nigeria
Gọomentị etiti ekwuola hoo ha na ọ masịghị ha maọlị etu Elizabeth Ndubuisi Chukwu si nwụọ na mba Saụt Afrịka.
Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche ụlọorụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi kwuru sị na ha ga-agba mbọ hụ na ha sogidere okwu ọnwụ a ma hụ isi ya.
Kedụ ebe a ga-ekpe ikpe Fatoyinbo?

Otu a kpọrọ "Coalition of Public Interests Lawyers and Advocates", ekwuola ka a ghara ibuga okwu onye ụkọchukwu a na-ebo ebubo mwakpo bụ Biodun Fatoyinbo Abuja.
Pelumi Olajengbesi na-ekwuchitere ha kwuru na ọ bụ na Legọs ka a gbara ya akwụkwọ, na ọ ga-aka mma ịnọ ebe ahụ kpee ya ikpe.
Owuite ọ na-akwado ijide ndị ụlọakụ Deutsche?

Ebe foto si, Reuters
Akụkọ ruru BBC ntị na-akọwa na a kwụsịrị ọtụtụ ndị ọrụ ụlọakụ a na-arụ na London, New York nakwa Tokyo ọrụ ha makana a chọrọ ime ka ụlọakụ ha "sie ike karịa etu ọ dị".
Ọ gbadola Serena Williams
Ekwe akụọla Serena Williams bụ aka na-apịa ncha na Tenis n'isi dịka ụlọikpe riri ya iwu maka imebi ihe n'ọgbọ Wimbledon.

Ebe foto si, Getty Images
Ha sị ya mapụta puku dọla iri were kwụọ iwu a.











