Mwakpo a na-eme n'ugwu Naịjirịa na-amapụ anyị obi - Gọọmentị

Ebe foto si, Reuters
Minista na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Mansur Dan-Alli kwuru na mwakpo ndị oyi ndụ egwu na nsogbu ndị ọzọ dị n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa na-amapụ ndị ọrụ nchekwa na gọọmentị Naịjirịa obi nke ukwuu.
Dan-Alli kwuru nke dịka ya na ndi ọzọ ọkwa ha gbagotere n'ihe banyere ọrụ nchekwa na onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ ụnyaahụ n'obi Buhari dị n'Abuja.
O kwuru na ọgbakọ a bụ ụdi ha na-enwe kwamgbe iji mee ka onyeisiala mara nke na-eme n'obodo.
Cheta na mwakpo ndị oyi ndụ egwu Boko Haram mere na Borno na Yobe steet tara isi ọtụtụ ndịagha Naịjirịa na nso nso a.
Nke a mere ka onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai jiri wepụ onye na-ahazi agha Boko Haram n'ọnwa gara aga.
Dan-Alli kwuru na onwere ihe ha kpebiri maka nsogbu a, mana okwughi ihe ọ bụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






