Ozubulu: Ndị uweojii anwụchiela Ezemmụọ Ndekwulu gbara aja

Ihu arụnsị

Ebe foto si, Getty Images

Egwu dị n'Ozubulu bụ isi ọchịchị obodo Ekwusigo dị n'Anambara steeti n'ihi nnwụchi ndị uweojii nwụchiri ezemmụọ Ndekwulu maka ị gọ ọfọ.

Eze mmụọ aha ya bụ Anazo Ilomuanya bụ onye e kwuru gọrọ ọfọ ma bụọ ndị niile aka ha dị n'ogbugbu ndị Ozubulu na Naịjirịa nakwa mba Saụt Afrịka ọnụ.

Ndị ọzọ a nwụchiri gụnyere Emeka Anaekwe, Okoli Udegbunnam, Ifediora Aloysius na Igbokwe Nnanyeleze.

Akụkọ kwuru na ndị ntoroọbịa a kpọrọ 'Concerned Indigenous People of Ozubulu' na bekee, chọrọ ụzọ a ga-eji kwụsị ogbugbu ụmụafọ Ozubulu na-aga n'ihu kemgbe otu afọ ọ malitere.

Ha nwee mkpebi ịga n'ihu arụsị Ndekwulu, mana mkpebi a adịghị ndị obodo mma n'obi nke mere ha ji kpọọ ndị uweojii.

Ndị uweojii bịara ebe ahụ ma nwụchie Ezemmụọ arụsị Ndekwulu bụ Anazo Ilomuanya dị afọ iri itoolu na anọ nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ.

Ụlọụka St Philip Catholic Church Ozobulu

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017

BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Muhammed ajụjụ, o kwuru na nke a bụ eziokwu.

Muhammed kwuru na dịka ọ dị ugbua na akpọpụla Ezemmụọ arụsị Ndekwulu na ndị ọzọ anwụchiri n'ụlọikpe ebe aga-egbe ha ikpe.

Akụkọ kwuru na ndị akpọrọ aha n'ihu arụsị Ndekwulu gụnyere ndị uweojii, ndị Ozubulu a na-ekpe ikpe na ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ, ndị ọkaikpe ji ikpe Ozubulu nakwa ụfọdụ ndị ndu obodo Ozubulu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọkụ ogene