Domestic Abuse in Abia state: Lee ka ikpe nwaanyị a sị wụnyere mmiri ọkụ n'ọnụ nwa odibo ya si aga
Okwu ọhụrụ adapụtala n'okwu nọ n'isi nwaanyị a kpọrọ Zazi David Orjiugo Kelechi a sị wụnyere nwa odibo ya bụ Ifunanya mmiri ọkụ n'ọnụ ma gbaa ya ose n'ike n'ọnwa Ọgọst, 2021.
Ụkwụ kpọrọ ikpe a nke kọmịshọna ndị uweojii n'Abia steeti bụ Janet Agbede ji n'isi nwaanyị a dịka e yigharịrị ikpe a ọzọ taa bụ Tuzde, ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị, 2022.
Cheta na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2021 ka akụkọ pụtara na nwaanyị a gbara nwatakịrị ya na ya bi ose n'ike ma wụnye ya mmiri ọkụ n'ọnụ nke kpụchara ime akpịrị ya.
N'oge ahụ, nwunye gọvanọ Abia Steetị bụ Nkechi Ikpeazu buuru ikpe a n'isi maa kwuo na ọ ga-ahụ na ndị uweojii nyere nwaanyị ahụ ntaramahụhụ dịịrị ya.
Gini mere ikpe ụbọchị Tuzde agaghi n'ihu?
BBC Igbo wuchiri n'ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia steeti ebe ikpe a nọ, mana ọkaiwu nwaanyị a bụ Chilaka S I Anyanwu zitere akwụkwọ ozi taa bụ Tuzde rịọ na ọ gaghị enwe ike bịa ya bụ ikpe n'ihi na ahụ adịghi ya.
Ọ gara n'ihi rịọ ka e yigharịa ikpe a n'ụbọchị nke mere ọkaikpe Onyeabor ji ikpe yigharịrị ya ruo ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị, afọ 2022.
Ọkaiwu gọọmentị kpụpụrụ nwaanyị a n'ụlọikpe bụ Ngozi J Obioma nọ ebe ahụ, Zazi David bụ nwaanyị a na-ebubo mere ihe a pụtakwara n'ụlọikpe.
Onye na-elekọta usoro ikpe n'ụlọikpe ahụ bụ Onyebuchi Ndukwe gwara BBC Igbo na nwatakịrị a sị emekpara ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ dị na Legọs bụ Lagos State University Teaching Hospital ebe ọ ka na-anata ọgwụgwọ.
Cheta na ọkaiwu nwaanyị a etinyebuola akwụkwọ mgbapụta mana ọkaikpe kagburu mkpesa ya ma kwuo na atụmatụ ahụ nwereike ịmerụ ikpe ahụ.
Kedụ ka ihe a si mee kpọm kwem?
Mgbe akụkọ a pụtara na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2021, Zazi kwuru na ọ bụ maka na nwata ahụ kụwara efere nri ya mere o ji mee ihe a
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọọgwụ ebe Ifunanya nọ anata ọgwụgwọ mgbe ahụ kwuru na ọ naghị ekwucha okwu nke ọma oge ahụ maka etu mmiri ọkụ ahụ si kpochapụ ya akpịrị nakwa ọnụ.
Mana nwanne nna ya bụ Ebere, onye gwara BBC Igbo okwu n'onyonyo a nọ ebe a, bụrụkwa onye du nwatakịrị ahụ gaa ụlọọgwụ ndị uweojii dị n'Umuahia ma na-elekọtakwa ya anya oge ahụ kwuchitere ya.
Dkt. Ikechukwu Nwaobi Okoye CSP bụ onyeisi ụlọọgwụ ndị uweojii n'Umuahia, kwuru oge ahụ na Ifunanya na-anabata ọgwụgwọ,
O kwukwara na ọ nọ na mgbeke BBC Igbo gara ebe ahụ.
Onye uweojii ji okwu ahụ (dịka ha kwuru mgbe ahụ na aka akparara Zazi ngwa ngwa) sị na ikep nwaanyị ahụ nọ n'aka kọmishọna uweojii steeti ahụ.
N'oge ahụ ya bụ kọmịshọna anọghị n'oche kwuturu BBC Igbo ọ zaghị kwanụ ekwentị ya.
Cheta na nwunye gọvanọ Abia Steetị bụ Oriakụ Nkechi Ikpeazu sị na ọ ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ nwata ahụ, ma nye iwu sị ka a taa nwaanyị kpara arụ a ahụhụ ruru ya.
Akụkọ ndị ga-amasi gị: