Etu DSS si kwụsị onye nnọchiteanya mba Briten bịara ịleta Nnamdi Kanu - Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Barr Ejiofor

Otu onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etiela mkpu maka etu ndị uweojii pụrụiche bụ DSS si gbochie ndị mmadụ abụọ ịhụ Kanu.

Ndị ahụ e gbochiri bụ Chukwuemeka Ezeife nakwa onye na-anọchi anya mba Briten bụkwa mba ọzọ Kanu si.

Ejiofor kọwara na ihe a DSS mere megidere iwu ụlọikpe nyere nke kwuru na mmadụ atọ ọbụla Kanu chọrọ nwereike ịhụ ya.

Mgbe onye nnọchiteanya mba Briten si Legọs bịa Abuja ịhụ Kanu, Ejiofor kwuru na ndị DSS gwara ya na o nweghi ike ịhụ Kanu n'ihi na ọ bụ onye mbịarambịara.

O kwukwara na ha gbochiri Brue Fein bụ ọkaiwu mba Amerịka bịara ịleta Kanu ugboro abụọ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba n'agbanyeghi na e zigara aha ya n'aka ndị DSS tupu ha malite njem ịleta Kanu.

Cheta na DSS egbochibuola Bruce Fein ịhụ Nnamdi Kanu n'ọnwa Ọgọst mgbe ha si na ezipuru ya ozi pụrụiche.

DSS gbochiri mụ na Bruce Fein bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu ịhụ ya - Ifeanyi Ejiofor

Ndị Ọkaiwu Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Barr Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), akọwaala etu ndị ọrụ nchekwa si gbochie ha ịhụ ya anya ọzọ.

Ejiofor bụ onyeisi ndị ọkaiwu Maazị Kanu kwuru na ndị Department of State Security Services (DSS) ekweghi ya na Bruce Fein bụ ọkaiwu na-ahụ maka okwu Kanu nke si mba Amerịka bịa, ịhụ ya anya.

Ọ sị na ha gwara ya na onye (DSS) kwesịrị ịnabata ha ebe ha na-ahụ Kanu anọghị n'ụlọọrụ ha ịnabata ha "n'ihi na ọ gara ozi pụrụ iche e zipuru ya".

Ejiofor kwuru sị na ihe a ndị DSS kwuru enweghi isi dịka o soghi na usoro ụlọikpe nyere maka ileta Nnamdi Kanu.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na kemgbe ha na-abịa elete Maazị Kanu na ha ezutetubeghi ụdị ọnọdụ a dịka ha na-eso usoro oge nakwa ụbọchị ndị ọrụ DSS nyere ha ka ha bịa lete ya.

N'okwu ya, o kwukwara na kemgbe ha ji abịa njem nlete enwetubeghi mgbe e ji si ha na enwere onye pụrụiche kwesiri i na-anabata ha, nke ka njọ bụ na ndị ọrụ DSS bụ ndị nyere ha ụbọchị abụọ n'izu ka ha bịa lete Maazị Kanụ nke bụ ụbọchị Mọnde na kwa Tọọzde nke gosiri na ọ bibịa ha abughi ihe mere na mberede maọbụ ihe ndenye.

Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na ka ha na-achụ aja ka ikpe na ama ndị mmụọ na okwu Maazị Kanu, nke bụ na ha ga aga njem nlete n'ụbọchị Mọnde dịka ndị ọrụ DSS si gwa ha.

O kwuru na ha na atụ anya na agaghi egbochi ha ịhụ Maazị Kanu anya ọzọ ma kwuo na ha ga agba mbọ zigara ndị ụlọikpe ihe a mere ma zipụtara ọha ozi n'okwu agwaa ọbụla ndị ọrụ DSS kpasara ha.

Nnamdi Kanu jail visit: 'Ka ndị DSS si gbachaa anyị ọtọ mgbe anyị gara ịleta ya' - Ejiofor

Ndị ọrụ DSS nakwa onye ọkaiwu Nnamdi Kanu

Ebe foto si, BBC/DSS

Onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etiela mkpu ọhụrụ gbasara ihe ya na ndị ọkaiwu ndị ọzọ gabigara n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS.

Nke a mere mgbe ha gara ịleta onye ọ na-anọchi anya ya bụ Nnamdi Kanu n'ụbọchị Monde ebe ndị DSS jichiri ya.

N'ozi o wepụtara o kwuru na nke na-aga n'ihu n'agbanyeghi na ha tiri mkpụ maka aka ike ndị DSS mgbe ha gara ịleta Kanu n'izu gara aga.

"Nke a mere anyị ji kwuo na anyị enweghizi ezi nchekwa mgbe ọbụla anyị chọrọ ịleta onye anyị nọchiri anya ya".

"Ọ na-atụzi anyị ụjọ ma ikpe Nnamdi Kanu a ka na-aga n'ihu n'ime ọnọdụ a anyị chọtara onwe anyị" ka o kwuru.

Ejioforo gara ihu kọwaa na agwa gosiri na ebumnuche gọọmentị bụ ime ka Kanu ghara ịnweta ikpe ziri ezi n'ebubo gọọmentị etiti boro ya.

O kwukwara na Nnamdi Kanu na-ekele ndị nso ya maka etu ha si kwadosie ya ike ma nọgidere ya.

Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ndị ọrụ nchekwa pụrụiche bụ "Department of State Services" (DSS) kpasara ya na ndị ọkaiwu ndị ọzọ na-akwado Maazị kanu agwa na ezighi ezi dịka ha gara ileta ya na ụbọchị Tọọzde.

Maazị Ejiofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụtara, nke isi okwu ya bụ "Ihe mere ka anyị gara nleta nke ụbọchị iri abụọ na Isii n'ọnwa Ọgọstụ, 2021"

N'ozi ya, o depụtara na ndị ụlọọrụ DSS nyochara ha ka ndị ohi, meenye ha ihere, ma napụ ha akpụ ukwu ha ma nye ha nani "Slippers" ka ha yiri ga hụ Maazị Kanu na ụlọ nga ebe ndị ụlọorụ DSS ji ya.

O depụtakwara na anapụrụ ha ugegbe anya ha, mkpisi na akwụkwọ ha ji ga ihụ ya.

Na nchịkọta okwu ya, Okaiwu Ejiofor sị na ya ezigarala ụlọikpe ozi ka tinye anya na ụdị agwa a DSS kpasara ya dịka ọ bụ ndị ụlọ ikpe nyere ha bụ ndị ọkaiwu ikike ị a leta Maazị Kanu.

Agwa a, n'okwu ya, bụ ihe mere ya ji ezipụta ozi a ka ọha nụrụ ihe mere.

Aha onyonyo, Ihe Simon Ekpa gwara BBC IGbo maka ọchụchụ nwere onwe Biafra

Maazị Ejiofor depụtara na ha agaghị anabata mmegbụ maọbụ mmaja ọbụla ma ha ga ileta Maazị Kanu ọzo dịka n'okwu o kwuru na ọ ma na ọ bụ atụmatụ ha imenye ha egwụ

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere otu DSS bụ Peter Afunaya na ekwe nti ya taa bụ Fradịdee mana ọ kwuru na ọgaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu ma ọ bụ eziokwu ma ọ bụ ugha.

Chetekwa na Maazị Ejifor gwara ọha ka njem nleta mbụ ọ mere si gaa, ya bụ n'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Ọgọst nke so ikike ha natara ọkaịkpe nọ n'isi okwu a.