Simon Ekpa: Ihe ise ọ gwara BBC Igbo na mkparịtaụka

Simon Ekpa bụ otu n'ime ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu Ipob na BBC Igbo mere mkparịtaụka n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọgọst, o kwuru ụfọdụ ihe dị ọkpụrụkpụ banyere ije ya na ịchụnta nwereonwe mba Biafra nke ụfụdụ ndị mmadụ na-achọ ka e si Naịjirịa kewapụta.
1: Maazị Ekpa bụ onye bi na mba Finland kwuru na nke bụ eziokwu bụ na o nwere oge ya adịghịdị ekwe isonye n'okwu nwereonwe Biafra.
Ọ sị: "O nweghị onye n'ime anyị so n'atụmatụ ịchụnta Biafra ugbua abụbughị onye na-ekwuchitere Naịjirịa. Onyeisi anyị Nnamdi Kanu so mee ngagharị maka ịkwado Naịjirịa."
Ọ sịkwa n'oge ya na-achị ndị Igbo na Finland na ya anaghịdị ekwe ka ewete ọkọlọtọ e ji achọ nwereonwe nso.
2: Ekpa sị na ọ bụ ka emechara ntuliaka 2019 ka ọ malitere chewe uche n'ọnọdụ ọ na-eche ugbua banyere Biafra.
Dịka o siri kọwara na ya na-akwado Atiku na Peter Obi makana ha "kwenyere na ha chọrọ atụmatu restructuring", mana ka ntuliaka ahụ gara etu o siri gaa, o mere ka uche ya gbanwee.
Cheta na Nnamdi Kanu n'onwe ya sịbu na ndị otu ya agaghị esonye na ntuliaka ahụ, mana o mechara kwuo na ya anabatala ka ha soro ma kwado pati "Peoples Democratic Party" (PDP) na ntuliaka ahụ makana ọ sị na ya enwetela "nkwekọrịta" n'aka Atiku na Peter Obi.
3: Ọ na-ache na agha daa n'etiti ndị Naịjirịa nakwa ndị na-acho nwereonwe na mba ofesi ụfọdụ ga-abịa kwunyere ha.
Maazị ji ihe mere na mba Libya were na-ama atụ dịka ihe nwereike ime na Naịjirịa ma ya bụrụ na agha daa maka atụmatu nwereonwe a.
Ọ bụ n'ọwụwa anyanwụ ka agha ga na-ada.
Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụkwa ebe agha dara n'etite Naịjirịa na ndị Biafra site n'afọ 1967 ruo 1970 mere, nke butere ọnwụ ihe ruru mmadụ nde atọ.
4: "Okwu na-ese na Ipob bụ atụmatụ anyi jiri chọọ ka a na-ekwu maka anyị" - Ekpa
Simon Ekpa ekweghị itinye ọnụ maka okwu ha na-ese aghara aghara n'Ipob, nke gụnyere ebubo na o kweghị ime etu ndị isi Ipob chọrọ ka omee, na akụkọ na ụfọdụ ndị ji ego ndị mmadụ tụtara na Ipob ekweghị iwete ya.
Ọsụsa Ekpa bụ esemokwu a niile bụ ụzọ ha ga-esi na-eme ka ndị mmadụ, ọkachasị ndị ntaakụkọ Naịjirịa na-anụ, ma na-akọ maka ha.
5: Ọ sị na Biafra ga-abụ mba a ga-enye ndị mmadụ ohere ife ofufe masịri ha
Simon Ekpa, dọrọ ndọrọndọrọ banyere ụfọdụ ndị ọwụwa anyanwụ na-ekpe okuperechi Alakuba dịka ọ sị na ndị si mpaghara ahụ na-ekpe ofufe ahụ bụ "fake". O mechara weghachia okwu ahụ were si na ya bụrụ na ha nwete Biafra na ha na-achọ, onye ọbụla ga-enwe ohere ikpere chi sọrọ ha.
Onye bụ Simon Ekpa?
Simon Ekpa dere n'akara Facebook ya na ya bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Finland.
Ọ gwara BBC Igbo na ya bụbu onyeisi ndị Igbo bi na mba Finland ruo afọ anọ.
Dịka Gọọmentị Naịjirịa nwuchiri ma kpọghachie Nnamdi Kanu ụlọ mkpọrọ dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo na ọ na-akpa nkata megide Naịjirịa, Simon Ekpa dere n'akara Facebook ya n'ọnwa Jụlaị na o nyere ya ikike iji Redio Biafra agbasa ozi.
Esemokwu dapụtara n'etiti ya na ndị isi Ipob a kpọrọ "Directorate of State" (DOS) dịka ha sị na ọ chọghị iso usoro ha ji agbasa ozi.










