Simon Ekpa: Agaghị atụrụ m etu m ga-esi gbasaa ozi na Radio Biafra

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Simon Ekpa, bụ onye Nnamdi Kanu nyere ikike ka ọ malite mewe mgbasaozi na Radio Biafra ekwuola na ya agaghị arụ ọrụ ahụ n'ọnọdụ ọ bụ ga-apụta dịka a na-atụrụ ya ihe ọ ga-eme.
Maazị Ekpa, kwuru okwu na ọba Facebook ya ụnyaahụ kwuru na ya nabatara atụmatụ Nnamdi Kanu ahụ n'obi ọcha.
Mana, dịka o siri kwuo, ụfọdụ mmadụ na-ewezi na n'ụzọ ọzọ.
Ekpa kwukwara na ndị mmadụ ghara itinye aha ha n'ịchụnta ego ọbụla ma ya bụrụ na ha ebughi ụzọ nata ikike n'aka ya.
Mana n' ọsịsa Ekpa nyere BBC n'ozi anyị zigara ya n'ọba ozi 'email', o kwuru na "esemokwu dịrị anyị bụ okwu ezịnaụlọ Ipob , na ọ gbasaghị ndị iro".
Ǹke a na-abịa dịka otu Indigenous People of Biafra (Ipob), n'aka ọnụ na-ekwuru na otu Ipob agbajọọla nhọpụta ha kwuburu onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu họpụtara Mazi Simon Ekpa dịka onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi ha bụ Radio Biafra.
N'ozi ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful binyere aka ma wepụta ụbọchị Wednezde, Ipob kwuru na ihe kpatara nke a bụ Ekpa anaghị eso ntuziaka etu esi arụ yabụ ọrụ.
Ọ sịrị, "Onye ndu anyị bụ Nnamdi Kanu nyere ntuziaka ka ọ nọ na mkpọrọ mana Mazị Simon Ekpa jụrụ iso iwu."O kwuru na "Simon Ekpa jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ iwu ji mgbasaozi na Radio Biafra."Ọ gara n'ihu kwuo na "Ipob bụ nnukwu otu agaghị agbanwe iwu ya maka ihi onye ọbụla."
"Simon Ekpa bụ nwaafọ Biafra na-agba ezi mbọ maka nnwereonwe Biafra, mana o nwere ike ọ gaghị aga n'ihu n'ịgbasa ozi na Radio Biafra."Ipob gara n'ihu kwuo na Maazi Simon Ekpa ka nwere ikike ịgbasaozi n'akara Facebook ya mana ọ gaghị abụsị onye mgbasaozi Ipob.
O tebeghị aka Ipob pụtara kwuo na ha nyere Ekpa ikike ikwu okwu na Biafra.
Nke ahụ mere ka gọọmenti Naijirịa pụtara kwuo na ha nwụchiri onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu n'ọnwa June ma kpupu ya ụlọikpe ebe ebugharịrị ikpe ya ruo ọnwa Julaị 26, 2021.
Akụkọ ka na-abịa
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









