Simon Ekpa: Ihe mere o ji sị na ọ bụghịzị onye Naịjirịa

Ebe foto si, Simon Ekpa Facebook Page
Simon Ekpa bụ onye otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ya abụghịzị onye Naịjirịa.
Ọ gakwara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọpụta aha ya maọbụ nye ya ihe dịka onye Naịjirịa.
O depụtara nke a n'akara Facebook ya n'ụbọchị satọde bụ Sepụtemba 12,2021.
Ekpa kwuru na ọ gaghị anabata nturugo otu akpọrọ "The Insitute of Management Consultants- Nigeria " nyere ya makana "ọ chọghị ihe ọbụla ga-eme ka Naịjirịa gaa n'ihu."
O kwukwara ọ na-eweghachị nturugo ọbụla e nyere ya na Naịjirịa maọbụ dịka onye nnọchiteanya , nke gụnyere ọla o ritere n'egwuregwu Naịjiria.
N'ọnụ ya, "a ga m ewere ọla ahụ m ritere n'aka Naịjirịa wegahchiri ministri na-ahụ maka egwuregwu n'Abuja n'oge na-adịghị anya."

Ebe foto si, Simon Ekpa facebook
Ihe ọhụrụ ndị ndu Ipob kwuru iji gosi na Simon Ekpa abụghị onye otu ha
Ozi ọhụrụ ndị isi otu Ipob nọ Finland zipụtara nke Maazị Anthony Obasi onye bụ onye ndụ otu a na mba Finland binyere aka kwuru na Simon Ekpa onye nọ na mba Finland edenyebeghi aha ya n'akwụkwọ dịka onye otu a.
Nke a mere ha ji pụta igwa ọha nke bụ eziokwu banyere MaazỊ Ekpa.
Akwụkwọ ozi a kwusiri ike, na Maazị Ekpa abụghị onye otu Ipob, dịka omezubeghi ihe njiri mara ndị nọ na otu a.
N'ozi a, Maazị Obasi dere:
"Akwụkwọ ozi a bụ ihe igba ama nye ọha niile, onye ọbụla na-ege Simon Ekpa nti n'okwu ihe ọbụla gbasara Ipob na-eme onwe ya"
Akwụkwọ ozi a kwukwara na nkwụpụta a bụ iwu Maazị Nnamdi Kanu nyere banyere Simon Ekpa.
Kedụ ihe jịkọrọ Simon Ekpa na Ipob?

Ebe foto si, Emma Powerful
Cheta na Maazị Ekpa zipụtara ozi site n'akara Facebook ya na-ekwu na ya enwetela ikike nke ọ sị si n'aka onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu ịmalite ikwu okwu na Redio Biafra bido n'ụbọchị nke asatọ n'ọnwa Julai.
Dịka o zipụtachara ozi a, chetakwa na ọnụ na-ekwuchitere Ipob bụ Emma Powerful gbara aka ebe na nke a bụ eziokwu mana na ọrụ Maazi Ekpa bịara ịrụ na Redio Biafra bụ ịgbasa ozi nani, nke mere na ọ bụghị ọnọdụ ịbụ onyeisi atụmatụ mgbasa ozi na Redio Biafra dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na soshal midia.
Kemgbe Maazị Ekpa bidoro ọrụ na Redio Biafra ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia enwela nghọteghe n'okwu ọkwa ya na ebe ruru ya n'ọchịọchị Ipob.
Ozi ọhụrụ agbala nke bụ eziokwu n'ọnwụ.
Simon Ekpa abụghị onyeisi ọhụrụ Ipob, ọ bụ ikike ikwu okwu na Radio Biafra ka e nyere ya - Emma Powerful

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Emma Powerful ekwuola na ọ bụ eziokwu na e kenyere Maazị Simon Ekpa ọrụ ikwu okwu na Redio Biafra.
O kwuru na-e kere ọrụ eke dịka "ndi mmadụ nwere ọrụ dị icheiche ha na-arụ iji hụ na nwereonwe Biafra bịara na mmezu".
Nke a na-abịa dịka Maazị Ekpa dere ozi n'akara Facebook ya na-ekwu na ya enwetela ikike n'aka onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu ịmalite ikwu okwu na Redio Biafra.
Maazị Ekpa dere na ya na-abịa ọrụ dịka onye odibo.

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Mana, Emma Powerful kwuru na nke bụ eziokwu bu na ọrụ Maazi Ekpa bịara ịrụ na Redio Biafra bụ ịgbasa ozi, nke mere na ọ bụghị ọnọdụ ịbụ onyeisi atụmatụ mgbasa ozi ahụ dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na soshal midia.
Ọ sị: "Siom Ekpa na-ekwubu okwu tupu a si ya bịa kwube okwu na Redio Biafra.
"Anyị nwekwara ndị ọzọ na ekwuo okwu nakwa akara ndi ọzọ e ji ekwu okwu."
Maazị Paul Achalla bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onye otu Ipob gwara BBC Igbo na ọ magburu onwe ya ma ọ bụrụ na e nyere Maazị Ekpa ohere a, mana ọ sị na ya enwetebeghị akaebe na nke a bụ eziokwu.
Ọ sị: "Maazị Ekpa bụ onye ọkaiwu na Finland ma bụrụkwa onye mara ihe ekwe na-akụ banyere njem Ipob ọfụma."
Ipob etisaala etisa?

Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Emma Powerful na-ekwusi ike na okwu ụfọdụ na-ekwu na Ipob amaghị ihe ha ga-eji onwe ha mee kemgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdị Kanu abụghị eziokwu.
Ọ sị: "O nwere usoro onyeisi anyị hibere bu etu anyị ga-esi mee ihe. Anyi na-esosi ya ike."
Maazị Powerful sịkwa na Ipob ka nwere atụmatụ a na-kpọ DOS nke Chika Edoziem nọ n'isi ya bụ ndị na-ahazị ihe na-eme n'Ipob ugbua Maazị Kanu nọ na mkpọrọ.
N'agbanyeghị nke a, ụfọdụ mmadụ na-ekwu na inye Maazị Ekpa ikike ga-enye aka chịkọta okwu Ipob n'otu ahịrị.
E nwere ụfọdụ ndị otu Ipob ọnụ na-eru n'okwu na soshal midia pụtarala kwuo na obi adịghị ha mma etu ihe sị aga n'otu ahụ kemgbe Nnamdi Kanu gara mkpọrọ.
Otu n'ime ha bụ nwaada a na-akpọ Efe, maọbụ Omote Biafra, bu onye pụtara boo ọtụtụ ebubo banyere nnwụchi gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Maazị Kanu.
Nwaada Efe si na aka ụfọdụ ndị isi ha gbagotere agbagote dị na nnwuchi ahụ.
Nnamdị Kanu ga-alaghachi n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako ịzara ọnụ ya banyere ebubo gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya na aka ya dị n'ịkpa nkata megide Naịjirịa nakwa iyi ndụ egwu.















