Nnamdi Kanu rearrest: Ihe mere m jiri jụọ mba Briten ajụjụ banyere Nnamdi Kanu - Lord Alton

Ebe foto si, UK Parliament/Nigerian Government
Lord Alton, bụ onye jụrụ gọọmentị mba Briten ajụjụ banyere onyeisi otu na-achọ nwereonwe site na Naịjirịa akpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdị Kanu, gwara BBC Igbo na ọ bụ n'ihi ịkwanyere usoro mba ụwa ji eme ihe ugwu ka o ji ajụ ajụjụ a.
Ọ sịkwa na ọ chọrọ ịmata ma nwaafọ Briten a ọ na-ewete enyemaka kwesiri ya n'aka ndị na-anọchite mba Briten na Naịjirịa.
Lord Alton sị na ajụjụ a ọ jụrụ bụ iji nwete ndo anya maa e sooro usoro mba ụwa jiri eme ihe n'oge e ji nwuchie Nnamdi Kanu ma kpọghachi ya Naịjiria.
Ọ sị na "usoro e ji mee ihe a edobeghị anya ma ncha n'ụzọ ziri ezi".
Lord Alton sị na ọ ma maka ebubo a na-ebo Nnamdi Kanu ma na-ekwu na iwu Naịjiria kwenyere na aka mmadụ ka dị ọcha ruo oge ikpe mara onye ahụ dịka "akara 36:5 nke iwu Naịjirịa nke 1999 siri kwuo".
Ọ sị na o na-eche mpụtara ikpe a, nke ọ sị na a "ga-emeriri n'usoro ziri ezi nakwa n'ụzọ ezoghi ezo"
Ọ sị, maka a sị na-asị sonyere okwu a, e kwesiri inwe ndị si ofesi ga-anọdụ dịka ndị akaebe.
"Nke ahụ ga-enye aka ịhụ na-anabatara mkpebi ọbụla enwetere."
Na ngwụcha, ọsịsa Lord Alton sara BBC Igbo bụ na ọtụtụ ndị omeiwu Briten tinyere uche n'ọnọdụ ikike dịrị onye nakwa usoro iwu na Naịjirịa ugbua.
N'ime ihe ọ rụtụrụ aka a na-etinye anya bụ etu e si ewepu ikike diri onye na mba ahụ, nke gụnyere:
Ohere ikwu ihe di onye n'uche
Ohere ịgbakọ etu onye siri chụọ
Ọzọ nwere mperi, dịka o siri kwuo, bụkwa ọnọdụ nchekwa adịghị nke sitere n'etu gọọmentị anaghi eme ihe o kwesiri banyere ọghaghara nakwantọrị mmadụ nke ndị abụghị ndị ọrụ gọọmentị na-eme aghara aghara na mba ahụ, ọkachasị n'ugwu nakwa etiti Naịjirịa.
Ajụjụ Lord Alton

N'ubọchị isii ọnwa Jụlaị, Lord Alton jụrụ gọọmentị Briten ajụjụ banyere Nnamdi Kanu. Lee ihe o jụrụ ebe a:
1: Dịka a na-ekwu na aka mba Kenya dị na nwuchi nakwa ịta Nnamdi Kanu ahụhụ?
2: Kedụ etu e siri kpọrọ Maazị Kanu kpọnye Naịjirịa, na-anataghị ya ikike?
3: Kedụ enyemaka ndị na-achọchite anya mba Briten na Naịjirịa na-enye ya?
E nwere ohere ịsa Lord Alton ajụjụ ndị ruo ụbọchị 19 nke ọnwa Jụlaị, 2021.
Ọ bu n'ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị ka Nnamdi Kanu ga-alachite ụlọikpe ịzara ọnụ ya.










