Nnamdi Kanu re-arrest: Onyeisi Ohaneze ekwughị na iju maka Nnamdi Kanu bụ mkparị - Alex Ogbonnia

Kanu

Ọnya na-ahụ maka mgbasa ozi ndị otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnia ekwuola na akụkọ na-efegharị na soshal Midia nke na-ekwu na onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru na ọ bụ mkparị ijụ ohaneze ma ha a ga-etinye aka na nwuchi Nnamdi Kanu abụghị eziokwu.

Ogbonnia kwuru sị, "Ihe a bụ nsogbu sitere na Soshal Midia, ọ nweghị mgbe Obiozor kwuru maọbụ chee uche ikwu ya bụ ihe. Ọ bụ akụkọ asị".

Ohaneze

Ebe foto si, Screengrab

Ọ bụghị nanị Obiozor ka ndị mmadụ na-etinye okwu ọ na-ekwughị n'ọnụ, akụkọ ga-egosi gị ụfọdụ ndị ọzọ -

Nke e boro Gọvanọ Okezie Ikpeazu

John Okiyi bụ ọnụ na-ekwuchitere Okezie Ikpeazu onye bụ Gọvanọ Abia Steetị ekwuola na akụkọ na-efegharị na soshal Midia nke kwuru na Ikpeazu gwara Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ tụọ Nnamdi Kanu nga maọbụ kpọhachi ya mba Briten bụ akụkọ ụgha.

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, John Okiyi /Facebook

Nkọwa foto, Akụkọ ụgha na-efegharị maka Gọvanọ Abia steeti na Nnamdi Kanu

Okiyi kwuru ka ndị mmadụ hapụ ịge ya bụ akụkọ ma sị na Gọvanọ Ikpeazu ka si njem ọ gara n'ofesi iji kpọbata ndị oji ego achụ ego na steeti ahụ dịka e siri maa n'ọkwa.

Okiyi kwuru sị, "O nweghị mgbe Gọvanọ jiri zaa ajụju ọnụ ọbụla maka ihe gbasara Nnamdi Kanụ".

Akụkọ ụgha maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, John Okiyi

O kwukwara sị na ha adịla njikere ịkpọpụ ndị bidoro ya bụ akụkọ ụgha ụloikpe dịka ha achọpụtala ndị na-ebu akụkọ ụgha a megide Gọvanọ Abia steet.

Akụkọ ụgha ndị ọzo na-efegharị maka nwụchị Nnamdi Kanu

Kanu

Kemgbe Gọọmentị etiti nwụchigharịrị onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu, akụkọ ụgha metụtara ya na-efegharị dịka aja adị n'ala.

BBC Igbo gbaliri ịchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ ụgha ise wuru ewu n'ime ha.

Lee ha:

1. Nke e boro Ohaneze Ndigbo Worldwide

Akụkọ ụgha maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Screengrab

Akụkọ na-ekwu na otu Ohaneze NdịIgbo kwuru na nnwuchi gọọmentị nwụchịrị Nnamdi Kanu egbochiela agha ma webata udo n'Ọwụwa Anyanwụ.

Mana onye na-ahụ maka mmekọ otu Ohaneze Ndigbo Worldwide na ndị ọha bụ Chiedozie Alex Ogbonnia kwuru na-enwebeghị ihe Ohaneze Ndigbo, maọbụ onyeisi ha bụ George Obiozor, kwuru maka nnwuchi Nnamdi Kanu.

Ogbonnia kwuru na akụkọ a na-efegharị bụ asị.

Akụkọ ụgha maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Ohaneze/Facebook

Ọ gara n'ihu kwuo na ha anaghị eji ọsịsọ edepụta akwụkwọ ozi.

Ha dọkwara ndị na-eme ụdịrị ihe a aka na ntị ma sị na ha mee ya ọzọ, na Ohaneze Ndigbo ga-eji iwu Naijirịa gosi ha ihe ọkụ ji ntị oke eme.

2. Nke e boro Asari Dokubo

Akụkọ ụgha

Ebe foto si, Screengrab

Ihe onyonyo na-efeharị nke gosiri ebe Asari Dokubo na-akwa Nnamdi Kanu emu ma sị na ọ ga-achọpụta ebe o zoro.

Nnyocha gosiri na nke a bụ asị.

Asari Dokubo

Ebe foto si, AsariDokubo/Facebook

Ya bụ ihe onyonyo bụ n'afọ 2020 ka ọ mere ya.

BBC Igbo kpọtụrụ Asari Dokubo maka nwuchi anwụchịrị Nnamdi Kanu kama o kwuru na onweghị ihe ọ chọrọ ikwu ugbu a.

3. Nke e boro Rochas Okorocha

Akụkọ Ụgha banyere Rochas Okorocha

Ebe foto si, Facebook

Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola n'akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya katọrọ nnwụchi a nwụchiri Nnamdi Kanu bụ okpotokpo asị.

Akwụkwọ mgbasaozi na-efegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuzde kwuru na "Rochas Okorocha akatọọla nnwụchi a nwuchirii Nnamdi Kanu."

Owele Rochas Okorocha

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo

Ozi ahụ nke bu aha ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemeodo kwukwara na "ọgụ megide otu Ipob maọbụ ESN bụ ọgụ megide ndị Igbo nke Ọchịchị Buhari na-alụ."

Mana Sam Onwuemeodo gwara BBC n'ekwentị sị "ezipụghị m ụdị akwụkwọ mgbasaozi ahụ."

Aha onyonyo, Rochas Okorocha: Etu ndị uweojii Imo ateeti si memina mụ na ndị otu m

4. Nke e boro Malami

Fake News Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Screengrab

Akụkọ ụgha ọzọ na-efegharị oge a nwụchịrị Nnamdi Kanu bụ nke eboro Mịnịsta Ikpe ziri ezi na Naijirịa bụ Abubakar Malami dere.

Ya bụ akụkọ asị kwuru sị "Ndị Igbo bụ ndị iberibe. Ọ bụ ha bụ nsogbu Naijirịa. Ndị awụsa ma ha dịka ohu ha bụ. Ha mara na ndị Fulani bụ ndị kachasị".

Aha onyonyo, Twitter Ban: Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed

Kama n'akwụkwọ ozi onye enyemaka Malami pụrụiche bụ Umar Gwandu depụtara, ọ kwuru sị "Onye ọkaikpe kachasị na Naijirịa na Mịnịsta na-ahụ maka ikpe ziri ezi enweghị mgbe o jiri dee maọbụ chee uche ịde maọbụ wepụta edemede mkparị a maọbụ nwee ebumnobi ịkọtọ agbụrụ ọbụla na Naijirịa".

Abubakar Malami

Ebe foto si, Abubakar Malami/Facebook

Ha kwuru na ụlọọrụ okaikpe kachasị na Naijirịa na-agwa ndị Naijirịa ka ha tụrapụ ya bụ akụkọ dịka akụkọ ụgha.

5.Nke eboro Chimamanda Adichie

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Getty Images

Nwaada Igbo na-ede akwụkwọ a ma ama, bụ Chimamanda Adichie agbaala ama na ozi na-efegharị maka nwụchighari Nnamdi Kanu nke ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ya dere esighị n'aka ya.

Kemgbe ụbọchị Monde, ozi nke isiokwu ya bụ 'Ntugharịuche maka nwoke a bụ Nnamdi Kanu' nke e tinyere aha Chimamanda Adichie na ya dịka onye dere ya na-ewu, na-efegharị na ọbaozi Whatsapp nakwa Facebook.

Ozi ahụ kwuru na ọ bụ naanị ndị Igbo bụ ndị na-akatọ Nnamdi Kanu bụ nwanne ha, na agbụrụ ndị ọzọ dịka ndị Yoruba anaghị ekwu okwu ọjọọ banyere Obasanjọ, maọbụ kwanu nke ndị Awusa na-ekwu okwu ọjọọ na social midia maka mkpakpa ndị Boko Haram na-akpa.

Akụkọ ụgha banyere Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Google

Mana Chimamanda Ngozi Adichie, site n'ozi nke ndị na-ahazi mgbasaozi ya wepụtara ụbọchị Tuzde, kwuru na ozi ahụ esighị n'aka ya kama o si n'aka nwaada Igbo ọzọ na-ede akwụkwọ aha ya bụ Gloria Ogo.

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi

N'ozi ha wepụtara n'akara Facebook nwada Adichie, ha sịrị, "Onye dere ozi ahụ bụ Gloria Ogo mana ndị amakekwu were aha Adichie tinye na ya bụ ozi."

Ha gaara n'ihu tinye akara ebe ndị mmadụ nwere ike inweta ozi ọbụla si n'aka Chimamanda Adichie.