Chidinma Ojukwu: Ụlọọrụ nga Naịjirịa 'arịọla mgbaghara' maka nghọtahe so asọmpị ‘Miss Cell 2022’ ha mere

Ebe foto si, Ncos/facebook/kiriri prison
Ụlọọrụ nga Naijịrịa bụ The Nigerian Correctional Service (NCoS) etinyela ọnụ n'okwu so asọmpị 'Miss Cell 2022' ha mere n'ụlọ nga ụmụnwaanyị nke Kirikiri Female Custodial Centre na Legọs steeti.
Ọnụ na-ekwuru NCoS bụ Francis Enobore kọwara na emume ndị dị etu a so na usoro ọrụ ha dịka ha na-agba mbọ ịhụ na ndị nọ na nga ha pụtara dịka ndị zuru oke ma nọrọkwa n'ọnọdụ dị mma.
Enobore rịọrọ mgbaghara maka etu ndị mmadụ si ghọtahe ya bụ asọmpị nakwa ebumnobi ụlọọrụ ha mgbe ha mere ya.
O kwuru: "Ihe a bụghị oge mbụ anyị na-eme ụdịrị ihe a, nsogbu nke a bụ na ọ pụtara ihe nke na abụghị atụmatụ anyị n'ezie"
Ọ gara n'ihu kwuo: "Cheta na anyị emerela ndị nọ na nga ụmụnwoke emume mmesapụ ahụ nke ọtụtụ ndị otiegwu a ma ama dịka Sam Okposu, Oyenka Owenu, Pasuma, Denrele, Lamboginny bịara gụọrọ ha egwu"
O kwukwara na ha na-ahazịrị ndị nọ na nga ọtụtụ mmeme nakwa ọzụzụ nke gụnyere emume ịgba egwu, ịgụ egwu, ịmụta ọrụ aka dị ịcheịche ma kọwa na ndị nọ na nga nwere ikike ime ihe ndị a dịka ha bụ ndị mmadụ. Ụlọọrụ nga Naijịrịa bụ The Nigerian Correctional Service (NCoS) etinyela ọnụ n'okwu so asọmpị 'Miss Cell 2022' ha mere n'ụlọ nga ụmụnwaanyị nke Kirikiri Female Custodial Centre na Legọs steeti.
Kedụ ka akụkọ asọmpị a si pụta ihe?
Chidinma Ojukwu, nwata nwaanyị ahụ a na-arụ aka maka igbu Michael Usifo Ataga, onye nwe Super TV, emeriela n'asọmpi onye kachasị mma n'ụmụnwaanyị ndị nọ na mkpọrọ, a kpọrọ "Miss Cell 2022'.
E mere asọmpi ahụ nke e hiwere maka ụbọchị Ncheta ụmụnwaanyị n'ụlọmkpọrọ Kirikiri dị na Legọs steeti, n'abalị Maachi 8, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ Ụlọmkporo bụ Rotimi Oladokun, Kọwara na asọmpi onye ka mma, egwu na ịkpaọchị so n'ihe nka ha mere iji cheta ụmụnwaanyị.

Ebe foto si, Kirikiri Prison
Ndị uweojii nwụchiri Chidịmma bụ nwa akwụkwọ mahadum 'University of Lagos n'abalị 23 nke ọnwa Juun afọ 2021 maka ebubo igbu Ataga notu ụlọ obibi nwa mgbe ta dị na Lekki ,Legọs.
Etu anyị siri chọta ozu Usifo Ataga - Onye akaebe

Ụlọọrụ nga Naijịrịa bụ The Nigerian Correctional Service (NCoS) etinyela ọnụ n'okwu so asọmpị 'Miss Cell 2022' ha mere n'ụlọ nga ụmụnwaanyị nke Kirikiri Female Custodial Centre na Legọs steeti.
Ọnụ na-ekwuru NCoS bụ Francis Enobore kọwara na emume ndị dị etu a so na usoro ọrụ ha dịka ha na-agba mbọ ịhụ na ndị nọ na nga ha pụtara dịka ndị zuru oke ma nọrọkwa n'ọnọdụ dị mma.
Enobore rịọrọ mgbaghara maka etu ndị mmadụ si ghọtaghe ya bụ asọmpị nakwa ebumnobi ụlọọrụ ha mgbe ha mere ya.
O kwuru: "Ihe a bụghị oge mbụ anyị na-eme ụdịrị ihe a, nsogbu nke a bụ na ọ pụtara ihe nke na abụghị atụmatụ anyị n'ezie"
Ọ gara n'ihu kwuo: "Cheta na anyị emerela ndị nọ na nga ụmụnwoke emume mmesapụ ahụ nke ọtụtụ ndị otiegwu a ma ama dịka Sam Okposu, Oyenka Owenu, Pasuma, Denrele, Lamboginny bịara gụọrọ ha egwu"
O kwukwara na ha na-ahazịrị ndị nọ na nga ọtụtụ mmeme nakwa ọzụzụ nke gụnyere emume ịgba egwu, ịgụ egwu, ịmụta ọrụ aka dị ịcheịche ma kọwa na ndị nọ na nga nwere ikike ime ihe ndị a dịka ha bụ ndị mmadụ.
Dịka Chidinma Ojukwu a na-ekpe ikpe maka aka ya dị n'ọnwụ onye nwe Super TV bụ Usifo Ataga pụtara n'ụlọikpe taa bụ Tuzde, otu onye akaebe akọwaala etu ha siri chọta ozu nwamadị ahụ n'ụlọozu ka ọ nwụchara ụbọchi emume ncheta ọmụmụ ya.

Ebe foto si, Kirikiri prison
Rotimi Albert bụ ezigbo enyi Ataga ma bbụrụ onye ya na ya gụkọrọ akwụkwọ gwara ụlọikpe dị na Legọs na ha malitere chọwa nwamadị ahụ ka ọ gachara abalị atọ ha jiri hụ ya anya ikpeazụ dịka ndị enyi ya na ụmụnne ya bi ala Bekee na-akpọ n'ekwentị na-ajụ ese ya.
O kwuru na ya onwe ya kpọrọ ya n'ekwentị ugboro ugboro ma zigara ya ozi mana ọ zaghị.
O kwuru na ha gara ogige ndị uweojii Panti inye mkpesa, ha kpọrọ ha gaa n'ụlọozu si ka ha mara n'ozu dị ebe ahụ ọ bụ nke ha na-achọ.
"Anyị hụrụ ebe a makasịrị ya mma n'olu nakwa n'afọ. Aka ya nwekwara ihe gosiri na e kere ya ụdọ n'aka, ahụ ya bụkwa ọbara ọbara."
Rotimi bụ onye akaebe nke anọ a na-akpọ n'ikpe Chidinma Ojukwu.
Cheta na a na-ekpe Chidinma Ojukwu bụ nwa akwụkwọ mahadum 'University of Lagos'na Adedapo Quadri ikpe maka ebubo igbu Usifo Ataga.
Chidinma Ojukwu agọọla ọzọ na aka ya dị n'ọnwụ Usifo Ataga n'ụlọikpe taa

Nwaada Chidinma Ojukwu agbaghaala ebubo asatọ e boro ya n'ọnwụ Usifo Ataga n'ụlọikpe taa.
Ya na onye ọzọ bụ Adebayo Qadri eboro ebubo a pụtara n'ụlọikpe kachasị dị na Legọs.
Nwanne ya nwaanyị bụ Chioma Egbuchi gọọrọkwara isi onwe ya na ọ natara ekwentị 'iPhone 7' nke Usifo Ataga.
Akaala ụbọchị 9 nke ọnwa Nọvemba maka ịmalite ikpe banyere ọnwụ Usifo Ataga n'uju ya.
Cheta na ụlọikpe Magistrate dị na Yaba, dị na Lagos, kpebiri na Chidimma Ojukwu e kwuru gburu onyeisi ụlọọrụ Super TV, Usifo Ataga ga-azara ọnụ maka igbu ọchụ na Lagos State High Court.
Ọkaiwu Magistrate dị na Yaba kpebiri nke a mgbe Chidimma na ndị ọzọ a na-eche so ya gbuo ọchụ gbara n'ihu ụlọikpe ahụ dị na Yaba ụbọchị Mọnde bụ Sepụtemba 6, 2021.
ụlọikpe Magistrate ahụ kpebikwara na onye nke abụọ aha ya bụ Adedapo Quadri, a na-enyocha ya na Chidimma ga-azara ọnụ ya maka igbu ọchụ ebe nwanne ya nwaanyị bụ Chioma Egbuchu ga-azara ọnụ makana ahụrụ ekwenti Usifo Ataga e gburu egbu n'aka ya.
Ọkaiwu Magistrate ahụ bụ Adeola Adedayo gbadoro ụkwụ na ndụmọdụ ngalaba Directorate for Public Prosecution, DPP wetere.
A ga-ewegazi ikpe a na High Court maka ikpe ndị a na-enyocha aha ha dị na akwụkwọ ndụmọdụ DPP.
Na June 2021 ka ndị uweoji chọpụtara ozu onyeisi ụlọọrụ Super TV, Usifo Ataga n'ime otu ụlọ oriri nkwarị dị na Lekki Lagos.
Ihe ndị uweojii kwuru dịka Chidimma Ojukwu kwuharịrị na ọ bụghị ya gburu Michael Ataga

Ebe foto si, Nigerian Police Force/Facebook
Ndị uweojii Legọs ekwuola na akụkọ ọhụrụ nwaada Chidimma Ojukwu na-akọ gbasara ebubo na ọ bụ ya gburu nwa amadị aha ya bụ Usifo Ataga, bụ akụkọ mbe agaba ajambene.Onyeisi ndị uweojii Legọs bụ Hakeem Odumosu kwuru na ha nwere akaebe nke ha ga-egosi ụlọikpe ebe nwaada Chidimma kwetara ugboro ugboro na ọ bụ ya gburu nwa amadi ahụ.
Etu Chioma Ojukwu si kwuharịa maka ebubo ogbugbo Michael Ataga
Nwaada Chidimma Ojukwu ọnye ndị uweojii gosipụtara otu mgbe dịka onye a na-ebo ebubo ịgbu Michael Ataga ekwugharịala sị na ọ bụghị ya gburu ya bụ nwoke.
Cheta na Ojukwu kwuru sị na Ataga dịnara ya n'ike mgbe ha nọkoro n'ụlọ, o kwukwara na ya bụ ihe gbawara ya obi ma kpasukwa ya iwe.
Ojukwu kwuru na ọ bụ dịka ha nọzị n'akọ ọnụ, ka nwoke ahụ ma chokwara idina ya n'ike ọzọ.
Ọ sịkwa na ọ bụzị oge ahụ ka ha bịdọrọ lụwa ọgụ, o weziri mma dị ya nso sugbuo nwoke ahụ n'ike.
Kama ihe onyonyo BBC Igbo hụrụ nsoso a gosiri ebe Ojukwu na-ekwu na ọ bụghị ya gburu Ataga.
O kwuru sị, " Amachaghị m ya nke ọma, kama ọ na-ewe iwe ọkụ, ya na nwunye ya na-enwekwa nsogbu".
Ojukwu kọwara na ọ bụ mgbe ọ lọtara ozi Ataga ziri ya ka ọ were ATM kaadị ya ga-weta ego ha ga-eji azụta ọgwụike na nrị ha ga-eri ka ọ hụrụ ozu ya n'ala n'ime ụlọ ha nọ.
O kwuru sị, "Mgbe m lọtara, ahụrụ m ọbara n'elu akwa, ma hụ ozu ya n'ala".
Chidimma Ojukwu kwuru na ọ bụ ndị maara na ha nọ ebe ahụ ma chere mgbe ọ pụrụ weere ohere ahụ gbuo Mazị Ataga.
O kwuru na ihe mere o jiri kwuo na ọ bụ ya gburu Ataga bụ maka na onye nche ebe ahụ kwuru na enweghị onye ọzọ batara ebe ahụ mgbe ọ pụrụ.
O kwuo sị, " Ụjọ dị m, echere m na onweghị onye ga-ekweta na ọ bụghị m gburu ya, ọ bụ ya mere m jiri kweta".
Ojukwu kwuru sị na otu ihe na-ewute ya bụ na ya agwaghị ndị uweojii na ọ mechara were ATM Kaadị Utaga ga were ego.
Kedụ ihe ndị ọzọ na-ekwu?
Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of YouTube post
Ihe onyonyo ọzọ si n'aka ndị uweojii akpọrọ 'Crimefighters' nke BBC hụrụ anya gosiri ebe nwanne Usifo Ataga bụ Franklin Ufua tinyere ọnụ n'okwu metụtara ọnwụ nwanne ya.
Ufua bụ onye ọkaiwu kwuru sị na o nweghi mgbe ọ ga-abụ naanị Chidinma kechiri nwanne ya aka ma gbuo ya dịka ndị mmadụ siri chee.
"A hụla m ozu nwanne anyị ihe ruru ugboro isii, eriri ahụ kawara anụ ahụ ya, o nweghi etu naanị nwaanyị ahụ ga-esi kechisie ya ike etu ahụ"
"Ndị nyochara ahụ ya n'ụlọ ozu na-eti mkpu ma gosikwa oghere buru ibu dị ya n'ahụ" ka o kwukwara.
Onye ọzọ bụ ezi enyi ya bụ Okoedo Adomi kọwara etu o si kpọọ ya ogologo oge n'ekwentị ya mana ọ zaghị nke mere ka ọ malite nchọpụta banyere ebe ọ nọ.









