A nwuchiela Lauretta Anoh maka isugbu enyi ya nwoke ma buru ụgbọala ya

Ebe foto si, Vincent Aluu/Facebook
Ndị uweojii Akwa-Ibom anwụchiela nwaagbghọ a na-enyo maka isugbu enyi ya nwoke buru ụgbọala ya gbalaga.
Dịka Vincent Aluu bụ enyị nwoke ahụ lara mmụọ siri kwuo, Lauretta Anoh gara n'ụlọ enyị ya nwoke bụ Chukwuemeka dị n'Osongoma dị n'Akwa-Ibom, sugbuo ya ma buru ụgbọala Mercedes Benz 4matic, Emeka ọhụrụ na akwụkwọ ụgbọala ya gbalaga.
Aluu, onye kwuru n'ozi o wepụtara na Facebook ya na Emeka bụ onye na-atụ ahịa kwuru na ọ bụ ka a na-acjhọ ya ka ọ bịa gbara ngwaahịa ya latara, ahụghị ya ka a gara n'ụlọ ya nwere hụ ya ebe ọdọ n'ozu ọ bara juu ya ahụ..
" E jiri traka ụgbọala chọwa ụgbọala ahụ ma nweta nwagbọghọ ahụ n'ụlọoriri na nkwarị ebe ọ nọ na-enweta onwe ya."
Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Akwa-Ibom bụ SP Odiko Ogbeche-Macdon, o kwuru n' ezie, na e wetara ha mkpesa banyere ya bụ mkpamkpa.
" E wetaara anyị mkpesa. Anyị anwụchiela nwaagbọghọ ahụ a na-ebo ebubo mana anyị agaghị ekwuli etu nwoke ahụ siri nwụọ n'ihi na anyị ka na-eme nnyocha ịchọpụta ihe mere."







