Nnamdi Kanu DSS Custody: Ihe ise nwanne Nnamdi Kanu nke nwaanyị kwuru maka ọnọdụ ya ugbua

Ebe foto si, Screen grab/Getty Images
Nwanne Nnamdi Kanu nke nwaanyị akpọrọ Chinwe Kanu Godwin ekwuola na etu a a na-akpọpụtaghị Nnamdi Kanu mgbe akpọrọ ya n'ụlọikpe ụbọchị Jụlaị 26, 2021 oge eruru ikpe ya ikpe agbaghị aka.
O kwuru na nke a gosiri na ihe adịchaghị mma makana o nwereike bụrụ na etịkatala Kanu ihe nke bụ na ha amaghị ka ndị mmadụ ga-esi nabata ya maọbụ na ahụike ya adịghị mma maọlị ịpụtanwụ n'ihu ọha.
Nwanne Nnamdi Kanu nke nwaanyị a kwuru ihe ndị a n'onyonyo o tinyere n'elu soshal midia.
N'ọnụ ya, o nwereike bụrụ na ndị DSS chọrọ ima ihe ndị mmadụ ga-eme.
O kwuru na ọ bụ udiri ihe a ka DSS mekwara n'afọ 2015 tupu ha bia igbucha ha niile na bee ha dị na Afaraukwu Abia steeti nke na-amitaghị mkpụrụ.
"A ma ndị DSS dịka ndị na-enupu isi nye iwu."
Chinwe Kanu kwuru na ọ chọrọ ka ndị na-eso Nnamdi Kanu mara ihe na-emenụ ugbua.
"Ugbua anyị amaghị ma Kanụ ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ nakwa ma ahụ adịkwa ya mma."
Ha na-eme ihe megidere iwu ikike dịara onye nke Nnamdi Kanu
"Ememinara Mazi Nnamdi Kanu na Kenya."
O kwukwara na ndị mmadụ hụrụ ka onye uweojii si were egbe na-amaja ndị biara Kanu ụbọchị Jụlaị 21, 2021 ma nwụchịe mmadụ 60(iri isii).
"Onyeisi anyị agaghị na-aga ụlọikpe anyị agbachị nkịtị makana anyị ma ihe gọọmenti Naịjiria pụrụ ime, ha nwereike igbu Kanu."
"Anyị nwere mkparịtaụka maka Kanu iji aka ya na-enwete nri ya."
"Ụbọchị ndị nke anyị gara iwegara Kanu nri na mkpọrọ DSS, ha wetere nri, ha si ha detụ ya ire mana e mere ka ha chere ruo awa anọ."
"Mgbe ndị nke anyị na-apụkwa, ha gbara ụfọdụ egbe n'okporoụzọ Lokoja, ha kwụsịrị ụfọdụ ha enweteghịnwụ n'Enugu n'otu ụbọchị ahụ."
"A maghị m ihe ha na-ezo makana etu e si kpụkpụ Nnamdi Kanu e zighị ezi nke ndị ọkaiwu anyị na-elebanya."
"Amaghị m ihe mba Britein ji gbachị nkịtị ma na-agwa ndị mmadụ na etu Kanu si bụrụ onye Naịjirịa mabụrụkwa onye Britein ekweghị ka ọdịchara ha mfe itinye ọnụ na nwụchị Kanu.
"Mazi Kanu jụrụ ibuzị onye Naịjirịa kamgbe afọ 2015 nke edebanyere n'akwụkwọ.
"Bikonụ ndị be anyị ụnụ agbahapụla Nnamdi Kanu, unu ekwela ka gọọmenti Naịjirịa maja ụnụ."
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru:
•Mmadụ niile chekwawa onwe ya maka oke mmiri ga-ezo, ihe a na-eme na ọwụwa anyanwụ na eyi egwu, a na-egbu ma na-awakpoo ndị ọrụ ụgbọ nakwa ụbị ndị mmadụ mana ọ gbasaghi ndị ọchịchị Naịjiria, ya mere m ji si mmadu niile chekwawa onwe ha.•Akụkọ "Logistics" a, edoghi anya maka ala Naijria nwere akụrụ ngwa were bulata Nnamdi Kanu mana ha na-ekwuzi na ha enweghi akụrụ ngwa i ji bufete ya n'ụlọikpe n'Abuja? •A na amajoo ọkaikpe Binta Nyako maka okwu ego a na-ebogide di ya na nwa ya nwoke, nke a bụ ka o ghari ikpe ikpe ziri ezi•Ha hapụ anyi ka anyị nwere onwe anyị, o nweghi uru anyị na-erite n'aka Naijịrịa, o nweghi ndị Igbo nwere oke ọbụla na omị mmanu ala Naijiria, uru adighiri anyị ebe a•Ihe a mere mu na ndị ozo jiri gbapụ Naijiria ga biri n'ofesi bụ maka ogbugbu ndị Igbo, lee zinu, ogbugbu a, ebibeghi










