Nnamdi Kanu Re-arrested Reactions: Ihe ọkaiwu Ipob sara gbasara nwụchịgharị Nnamdi Kanu na mkpọghachite ya na Naịjirịa

Nnamdi Kanu/Alloy Ejimakor

Ebe foto si, Nnamdi Kanu/Alloy Ejimakor

Ọkaiwu Indigenous People of Biafra bụ Alloy Ejimakor ekwuola na ọ maghị na a ga-anwụchị Nnamdi Kanu makana ọ hụghị iwu ọ dara ebe ọ na-ekwu okwu nwereonwe.

O kwuru na o chere na Kanu nwere echiche ndọrọndọrọ nke ndị mba ofesi ọ nọ na bee ha na-akwado mana gọomenti Naịjirịa chọrọ ipịnyụ ya.

Aha onyonyo, 'Igbo niile kwesiri ịpụta katọ ihe e mere ndị Ipob n'Emene'- Ọkaiwu Ipob

Ejimakor kwuru na obi dị ya ụtọ na Nnamdi Kanu ga-enwezi ohere kọọ akụkọ ya gbasara ebubo e boro ya na ọ gbahapụrụ nwụchị n'afọ 2017.

Jọstis Binta Nyako nke Ụlọikpe Abụja nyere iwu ka e jichie Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS were rue abalị 26 nke ọnwa Julai bụ oge a ga-akpụpụta ya n'ụlọikpe ọzọ.

Nke a na-abịa dịka Ọkaiwu nọchitere Gọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Kanu.

Onye ọnụ na-eru n'okwu n'Alaigbo bụ Mbazuruike Amechi adọọla gọọmentị etiti aka na ntị gbasara Nnamdi Kanu bụ onye ha nwuchiri kemgbe ụbọchị ụka.

Ihe emekwala Nnamdi Kanu- Mbazulike

ws_programme_1024.jpg

Amechi gwara gọọmentị ka ha kpupu Nnamdi Kanu ụlọikpe ka ọ ga zara ọnụ ya kama imeru ya ahụ.

N'ọnụ ya, e chere m na onye chọrọ ịnọchapụ na mba ya, mkparịtaụka ga-adị mma karịa ịnwụchi ya.

N'ọnụ ya, "ọ bụrụ na m bụ onyeisiala Naịjirịa, mmadụ a sị m na ọ chọrọ ikewapụ na mba m, m ga-enye ha ohere ka ha nwe mkparịtaụka maọbụ tụọ vootu gbasara nkewapụ ahụ."

Amaechi gara n'ihu kwuo si "ụmụaka ndị Boko Haram na-egbusisi ndị mmadụ o nweghị ihe e mere ha.

Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu ụbọchị ụka(June 27, 2021) maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Labaran kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017 mana ọ gbara ọsọ.

Cheta na Kanu gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike.

Aha onyonyo, Ihe mere Facebook ji machie Nnamdi kanu