Gas Explosion in Ladipo: Ndị nwụrụ n'ihe mberede ogbunigwe gaasị na Ladipo,Legọs, eruola mmadụ ise

Ihe mberede gaasị

Ọnụọgụgụ ndị tufuru ndụ ha n'ihe mberede ogbunigwe gaasị nkere na Legọs taa, eruola mmadụ ise.

Ọ bụ ngalaba gbatagbata a kpọrọ 'Lagos State Emergency Agency' kwuru nke a n'ụtụ Tuzde.

Ọdachi a dapụtara n'ogbe a kpọrọ Ojekunle street, nke dị na mpaghara ahịa Ladipo.

Ihe a mere n'ebe elekere asaa nke ụtụtụ taa bụ Tuzde, abalị Nov 16 nke afọ 2021.

Aha onyonyo, Gịnị bụ ogbunigwe n'Igbo?

Ọ bụ n'ebe a na-adọba karama gaasị e ji agba ihe ọkụ ka ya bụ ihe mere.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ebe ihe a mere na-ekwu na eburula ọtụtụ ndị ọzọ ya bụ ihe metụtara gawa ụlọọgwụ.

Ihe mberede gaasị

Ya bụ ogbunigwe gaasị metụtakwara ụfọdụ ụlọ ndị nọ nso n'okirikiri ahụ.

Ugegbe ụlọ niile dị n'ụlọ ndị ahụ kurichara akụri.

Ihe mberede gaasị
Nkọwa foto, Ugegbe ụlọ dị n'okirikiri ahụ gbawachara

Ndị ọrụ gbatagbata bịara n'oge iji gbochie ọnọdụ ahụ ịkawanye njọ.

Ihe mberede gaasị
Ihe mberede gaasị
Ihe mberede gaasị
Ihe mberede gaasị
Ihe mberede gaasị