Ogbunigwe agha Biafra emerụọla ụmụaka abụọ ahụ n'obodo Eziorsu Ugwuta dị n'Imo steeti

Ebe foto si, Anambra Police
Ogbunigwe a na-eche si n'oge agha Biafra agbaala ma merụọ ụmụnne abụọ ahụ n'obodo Eziorsu dị n'okpuruochịchị Ugwuta n'Imo steeti.
Ụmụaka ihe a metụtara bụ Confidence Uzi dị afọ 16 na nwanne ya bụ Chinedu Uzi dị afọ 10.
Otu onye okenye n'obodo ahụ aha bụ Chukwujekwu Charles Jeruo gwara BBC n'ekwentị na ụmụaka a na-eghe garị oge ihe a mere n'ubọchi Tuesday.
Maazị Jeruo sị na ihe mere n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde nke bụ ubọchị 18 nke ọnwa Ọgọstụ.
"Ụmụaka a na-eghe garị mana ha amagị na ihe ha ji bụ ogbụnigwe. Ọ sị na ọ bụ ka igwe a natara ọkụ ka ọ gbara were merụọ ụmụaka a ezigbote ahụ."
Ọ sị na ọ metụtara na n'aka, n'ukwụ ma n'ihu.
N'agbanyeghi na ụfọdụ akụkọ n'ekwu na otu n'ime ndị ihe a metụtara anwụọla, onye ya na BBC Igbo kwuru sị na ha abụọ ka dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ.
Nna ụmụaka hau bụ Goddy Izu kọwakwara BBC etu o si mee nakwa ọnọdụ ụmụ ya ugbua.
Ọ sị na igwe ahụ dị na be ya kemgbe, kama ha amaghị ihe ọ bụ.
Ọ sị; "egwupụtere m ya oge m na-arụ ebe a na-esi nri, mana anyị che na ọ bụ igwe. Makana igwe siri ike, anyị na-eji kari ya eti akị."
N'afọ 2019 BBC gara Eziorsu dịka ogbunigwe gbara ebe ahụ gbụrụ ụmụaka atọ na-achọ igwe ha ga-ere.
N'oge ahụ, Igwe obodo ahụ gwara BBC na ọjọ ogbinigwe na-atụkari ndị be ha makana ndị agha nọsị ebe ahụ n'ike n'oge agha Naịjirịa na Biafra.
Ọ si na nke bụ nkọwa ọtụtụ ogbunigwe a na-egwupụta na be ha.








