Landmines: Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe ọbụla n'ogbe gị

Ebe foto si, Anambra Police
Ogbuniwe na ihe mgbawa dị iche iche a kpọrọ un-exploded ordinances (UXOs) bụ ezigbo nsogbu nye ọtụtụ obodo dị na mbaụwa.
Nke a bụ n'ihi ọgbaaghara, agha, ọgụ na mwakpo na-eme na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa ugbua.
Ndị mmadụ na-eji ngwaagha dị iche iche dịka egbe, mgbọ nakwa ogbunigwe bụ nke ha na-atọgbọ n'ụzọ na-amaghị ama.
A bịa na mpaghara ọwụw anyanwụ nke Naịjirịa e nwere ogbunigwe ndị dịcha n'ime ala nke e ji lụọ ọgụ Biafra (afọ 1967 ruo 1970).
Mana ugbua ndị mmadụ na-arụzi ụlọ nakwa ịkọ ọrụ ugbo n'ebe ogbuniwe ndị a nọ na-amaghị na ụfọdụ ha ka nwere ikike ịgbawa.
Ọtụtụ oge ka a na-achọpụta ogbunigwe ndị a n'ala. Na nso nso a ndị uweojii n'Anambra gbawara ogbunigwe achọpụtara n'Ọka.
Ya mere akụkọ a bụ iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha mara ihe ha ga-eme ma ha buru ụzọ chọpụta ogbunigwe n'ogige ha.
Ụzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma ịchọpụta ogbuniwe n'ogige gị:

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed siri kọwa etu ndị mmadụ ga-eji chekwaa onwe ha ma ha zute ogbunigwe n'ogige ha bụ:
- Ị chọpụta ogbunigwe n'akụkụ ụlọ gị, rie mbọ mbọ ọsọ si n'ogige ahụ pụọ
- Anwakwala anwa sị ka i were aka gị mepee, hichaa maọbụ metụ ogbunigwe
- Gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii, ha ga-abịa chụpụsịa ndị mmadụ n'ogbe ahụ
- Ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe ga-abịa wepụ ya ma buru ya gaa ebe ha ga-agbawa ya
- Ị gaghị aba n'ogige ahụ ọzọ ruo mgbe ndị uweojii ga-asị na ogbunigwe adịghizi ya
- E jikwala ogbunigwe dosa n'ụlọ dịka ihe nlereanya maka na o nwereike ịgbawa
- E jikwala ihe dị ka ekwenti bịa nso n'ebe ogbunigwe nọ
- Cheta na agbanyeghi afọ ole maọbụ ụdị nchara ogbunigwe tara, na ọ ka nwere ikike ịgbagbu mmadụ
- Buru ya n'obi na i nwereike izute ogbunigwe ebe ọbụla gụnyere n'ime ọhịa, ọrụ ugbo, ebe obibi dgz.









