Ọ bụghị ogbunigwe gbara n'Enugwu- Ndị uweojii

Onye na-ekwuchitere ndị uweoji ọnụ ha n'Enugwu steeti bụ DSP Ebere Amaraizu ekwuola na ihe ahụ gbawara n'ụlọ ụka Holy cross Iji Nike ụbọchị Monde abụghị ogbunigwe.
O kwuru na ọ bụ ọkụ oyibo eji eme mmemme(fireworks).
Amarizu kowara na ozigbo ihe ahụ mere na ndị uweoji ogbunigwe di na aka were ọsọsọ gaa na ya bụ ulọụka ịga chọpụta ihe merenụ
Mana oge ha rutere ebe ahụ ha chọpụtara na ya bụ ihe akpaghị ike dika O kwukwara na ọ kwatugikwa ụlọụka ma ọli.
Mgbe BBC batara na ya bụ ụlọụka anyị hụrụ na eji nnukwu igodo gbachie ụlọụka ahụ nke mere na anyị abaghị n'ime ya.

Onye isi nchụ aja na ya bụ Holy Cross Catholic Church, Iji Nike, Enugwu steeti, bu Reverend Father Emmanuel Okwor anọghị oge anyị rutere nụlọ ụka ahụ.
Ndi mmadu jukwara na ya bụ ụlọụka na-ekpe ekpere.
Cheta na ya bu ihe gbara unyahụ oge ndi mmadụ na-abia uka.








