Nsogbu ọgwụike metutara mmadụ niile - Emzor

Ndị ọlụ Emzor na onyeisi ha
Nkọwa foto, Stella Chinyelu Okoli kwuru na ụlọọrụ na-eme etu okwesiri

Na mkparịtauka ndị Emzor na ndị ntaakụkọ nwere taa, onye nwe Emzor bụ Stella Chinyelu Okoli kwuru na codeine nwere ọrụ ọma ọ na arụ na ahu mmadụ mana ndị mmadụ ne-eji ya eme ọgwụike, ma kwuo na nsogbu sitere na ya metụtara mmadụ niile nke mere aka niile ji kwesi ikwado ịhụ na ahụrụ ihe a ga-eme gbasara ya.

Ndị Emzor kwuru na onweghị mgbe ha jiri nụpụ isi maọbụ ghara ịkwanyere ndị npaghala gọọmentị na-ahu maka nrị na ọgwụ bụ NAFDAC ugwu ruru ha mgbe ha bịara ụlọọrụ mgbe ha akụkọ banyere codiene ndi BBC mere pụtara.

Cheta na nkọwa NAFDAC bụ na ihe ha jiri gbachie ụlọọrụ Emzor na ndị ọzọ bu maka na ha e nyeghi ha nkwado ka o si kwesi.

Oriakụ Okoli gara n'ihu kwuo na ịṅụ ọgwụ ike bụ ihe ekwesiri ijiri me ezigbote mkpa, okachasị etu o siri emetụta ndị ntoroọbịa.

O kwuru na Emzor na-enye aka maka ihe metụtara ndị ntoroọbịa site na "Chike Okoli Centre for Entrepreneurship" nke dị na mahadụm Nnamdị Azikiwe n'Ọka na "Emzor Wellness Club" bụ nke metụtara ndi nọ na ụlọakwụkwọ praimari nakwa sekondiri.

Ndị Ntaakụkọ na mkparịtaụka Emzor

Mana na ajụjụ na azịza sotere okwu ndi Emzor, otu onye ntaakukọ jụrụ etu mgbachi a siri metụta ha, Emzor sara na ha amabeghị, maka na onwere ọgwụ ha tinyere ebe a na-emepụta ha, nke ha amabeghị ọnọdị ha ugbua.

Okoli gakwara n'ihu kwuo na mmetụta di na ụdi na ụdị, na ọbughị so ego na akụnaụba ka ihe metụtara.

Aha onyonyo, Codeine, ọtọmegbum

Na ozi NAFDAC zipụrụ maka mgbape Emzor na ndị ọzọ mgbachi a metụtara, he kwuru na ha dara ha iwu ma na-asi ka Emzor kpọta onye ọrụ ha ihe onyonyo a gosiri ka ọ na-ere ọgwụ a.

Emzor sara sị na ha amabeghi ka adara ha nha maọbụ adaghị ha.

N'okwu onye ọru ha, ha kwuru na ha chụru ya n'ọrụ ma gakwa n'ihu nye ndị uweojii ihe niile ha ma gbasara ya, nke mere ha jiri sị na ọ bụ ndi uwejii ka ọ dị n'aka.

Cheta na NAFDAC gbachịrị ụlọọrụ Emzọr na ụlọọrụ abuo ndị ọzọ na-emepụta codeine (Bioraj na Peace Pharm) ndị ọrụ ha pụtara na ihe onyonyo BBC mere maka mpụ di na orire codeine.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ