Ogbunigwe ataala isi ụmụokorobia atọ n'Eziorsu Ugwuta, Imo steeti.

Ngwarịa igwe
Nkọwa foto, Ebe ogbunigwe nọrọ gbagbue ụmụokorobịa atọ n'Eziorsu, Ugwuta Imo steeti

Ndị obodo Eziorsu dị n'okpuru ọchịchị Ugwuta, Imo Steeti nọ na nnukwu ịkwa akwa na iru uju n'ihi ogbunigwe gbagburu ụmụokorobịa atọ na-akụ ọgbọkọrọ igwe dịka akaọrụ ha.

Mkpamkpa ahụ kpara n'ehihie Tọọzde abalị isii nke ọnwa Juun, afọ 2019 oge Ukado Elvis (16) , Uzoma Kasie (17) na Chidindu Justice (14) na-akụgọ igwe nakwa akpakaradingwom ndị ọzọ ka ha were dozie ya ka a ga-esi buru ya gaa ahịa.

Maazi Ukado onye nwa ya nwoke nwụrụ na ya bụ ogbunigwe kọwara na nwa ya nwoke na mmadụ abụọ ndị ọzọ nwụrụ anwụ amaghị na ya bụ ọkpụrụkpụ Igwe ha na-akụgọ bụ ogbunuigwe.

"Ngwangwa ha mụnyere ya ọkụ ka ha rechapụ azụ ya, ọ gbagburu ha atọ."

Maazi Ukado
Nkọwa foto, Mazi Ukado, nna Elvis Ukado onye ogbunigwe gbagburu

Pastọ Chukwunanso Derue bụ onye nwanne ya nwụrụ kwara arịrị na ụmụaka atọ ahụ nọ na agbata afọ iri na anọ na iri na asaa ji ịtụtụ na ịkụ igwe na-enyere onwe ha aka karịa ịnọ nkiti ma ọ bụ izu ohi.

Ọtụtụ ndị Eziorsu gwara BBC na nke a abụghị izizi nke oji abụ abụọ ha na ahụ ụdị ogbunigwe a n'Ugwuta nakwa gburugburu ya.

Eze Victor Ijoma
Nkọwa foto, Eze Victor Ijoma bụ aka na-achị Eziorsu dị n'Ugwuta Imo steeti

Eze ndị Eziorsu bụ Victor Ijoma kwuru na ọ bụ ihe mwute na ogbunigwe ụfọdụ na agbaghị na oge a lụrụ ọgụ Naịjiria na Biafra jupụtara na Eziorsu nakwa Ugwuta nke mere ndị mmadụ ji e gwuputa ya n' ime ọhịa kwamgbe, kwamgbe.

Eze Ijoma kwuru na Ugwuta so na ebe ọgụ Biafra kporo ọkụ na agbata afọ 1968 na 1970, were yọọ ndị ọrụ nchekwa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

Otu nwoke Charles Lawrence kwukwara na ya onwe ya abọpụtala egbe abụọ n' ugbo ya, mana ọ tunye ya n'ime mmiri.

O kwukwara na ọtụtụ mmadụ ebutela ogbunigwe n'ubi ha, ma nye ya ndị uweojii.

Iliozu

Ndi Obodo Eziorsu elielarịị ụmụ aka atọ ahụ. n'ihi na ya bụ ogbunigwe gbarisiri ahụ ha pịa pịa.

Akụkọ ga-amasị gị: