NUJ, NGE, Media Rights akatọọla mmachi a machiri AIT na Raypower

Njirimara AIT

Ebe foto si, @AIT_Online

Otu jịkọtara ndị ntaakụkọ na Naijiria nke a kpọrọ NUJ n'aha ịchafụ na nke jikọrọ ndị isi ụlọ ntaakụkọ (Nigeria Guild of Editors) na ụlọọrụ ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ndị ọrụ ntaakụkọ bụ Media Agenda akpọọla okwu aha.

Ha akatọọla mmachi a machiri ụlọọrụ ntaakụkọ DAAR Communications bụ ndị nwe Africa Independent Television (AIT) nakwa Raypower FM.

Ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ikuku bụ National Broadcasting Commission(NBC) napụrụ AIT na Raypower ikike mgbasaozi ha n'ụbọchị Tọọzdee n'ihi ihe ha kpọrọ "nnupu isi n'iwu mgbasaozi."

Mana onyeisi otu NUJ bu Christopher Isinguzo gwara BBC Igbo na mmachi a machiri AIT na Raypower megidere iwu nnwereonwe nke ndị ntaakụkọ nke Bekee kpọrọ, 'Press Freedom'.

Isinguzo kwuru na ọ bụrụgodu na ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ dara iwu dika NBC si bo ha n'ebubo, ọ dị ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi taa ha ahụhụ karịa ị napụ ha ikike ha ji arụ ọrụ ma ọbụ mechie ụlọọrụ ha. Otu n'me ụzọ ndia gụnyere ime ka ha kwụọ nnukwu ụgwọ.

Onyeisi otu NUJ ahụ kwukwara na ọ ga-amagbu onwe ya ma NBC nyeghachi AIT na Raypower ikikere mgbasaozi ha ma werezie nwayọọ chọwa otu ha ga-esi taa ụlọọrụ ahụ ahụhụ ma ọbụrụ na ha dara iwu n'ezie.

Raymond Dokpesi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Raymond Dokpesi bụ onye nwe Daar Co mmunication, ụlọọrụ nwe AIT na Raypower

N'otu aka ahụ, otu Nigeria Guild of Editors katọkwara mmachi ahụ NBC machiri AIT na Raypower.

Onyeisi otu ahu bu Funke Egbemode rịọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka o were ikikere ya dịka onyeisiala wee nye iwu ka NBC nyeghachi ụlọọrụ DAAR ikike mgbasaozi ha.

Ọzọkwa, Edetaen Ojo bu onyeisi otu Media Rights Agenda kwukwara na NBC emeteghi ya ịnara AIT na Raypower ikike mgbasa ozi ha.

Ojo gwara BBC Igbo na NBC abụghị iwu n'aka onwe ya nke na ha ga-abụ onye mkpesa bụrụkwa onye ọkaikpe n'okwu ahụ.

Ọ sịrị: "Anyi agaghi egbu oge ịkpụpụ NBC n'ụlọ ikpe ma ọbụrụ na ha enyeghachighi AIT na Raypower ikike mgbasaozi ha."

Ishaq Modibbo Kawu kwuru na NBC dọrọ DAAR Communication aka na ntị ugboro ugboro man ha egeghi ntị

Ebe foto si, Modibbo Kawu/Twitter

Nkọwa foto, Ishaq Modibbo Kawu, onyeisi National Broadcasting Commission (NBC)

Ebubo NBC boro DAAR Communication gunyere na ji emume onyoonyoo ha nke a kpọrọ 'Kaakaki Social' agbasa ozi nwere ike ibute iwe nakwa ọgbaaghara n'obodo.

Onye nọ n'isi oche NBC bụ Ishaq Modibbo Kawu kwuru na ha adọọla ụlọọrụ DAAR aka na ntị uboro ugboro ka ha kpachara iche etu ha si eji ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia were agbasa ozi na onyoonyoo tiivii mana aka na ntị nile ndị ahụ dara n'aja.

Ụlọọrụ DAAR n'aka nke ha gọrọ na onweghi iwu ọbụla ha dara kama na NBC ma ụma agụ nwa nkịta ajọ aha iji wee kugbuo ya.

Akụkọ ga-amasị gi: