Ihedioha Vs Okorocha: Ụjọ nnyocha adịghị atụ m - Rochas

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Rochas Okorocha chịri steeti Imo afọ asatọ

Onye chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ụjọ ọbụla anaghị atụ ya banyere nnyocha nke Emeka Ihedioha bụ onye na-achị Imo ugbua sị na ya ga-enyocha ọchịchị ya.

Ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Ebere Nzewuji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Wenezdee.

N'ụbọchị Tuzdee, Ihedioha kwuru na ya ga-enyocha ndị ọchịchị Imo steeti garala aga ma gbaa nke ọbụla n'ime ha zuru ego steeti ahụ n'anwụ.

O kwuru nke a na mbido ọgbakọ ndị omeiwu Imo steeti nwere n'Oguta.

Ihedioha kwuru: "Aga m akpọ ndị orụ nchekwa dị iche iche ka ha nyochaa ndị nile chịburu steeti a."

Ihedioha
Nkọwa foto, Ihedioha banyere ọchịchị dịka Gọvanọ Imo n'abalị 29, nke ọnwa Mee, afọ 2019

Onye ọbụla n'ime ha mere nrụrụaka ga-agbọ ihe o riri.

Mana Okorocha site n'ọnụ Nzewuji gwara BBC na ihe dịrị Ihedioha ugbua bu ịgba mbọ ịhụ na ọ rụrụ orụ ya nke ọma dịka gọvanọ karịa ị na-agagharị na-akọtọ aha Okorocha.

"Uwa nile ma nke oma na o nwebeghi gọvanọ n'Imo steeti rụrụ ọrụ dịka anyị si rụọ. "

Okorocha onye kwuru na Ihedioha na-eme nke a iji kpasasị ndị mmadụ anya n'ihe o kwesịrị i mere ndị Imo,sịrị, "Ihedioha kwesiri ịgbado anya mara ma ọ ga-arunwu ọkara ihe Okorocha rụrụ n'Imo steeti."

O kwukwara na ọ baghị uru izaghachi Ihedioha na-ebubo ọ na-ebo Okorocha, tụmadị nke ọ sịrị na Okorocha ahafeghị ya ọchịchị n'aka nke oma.

"Ihe ndị ahụ nile bụcha asị asị."

O siri ọnwụ na-ekwu Okorocha hafere Ihedioha ihe nile ga-adị ya mkpa n'ọrụ ya dịka gọvanọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ndị Igbo na Naịjirịa: Ihe Abaribe kwuru maka ọnọdụ ndị Igbo na Naijirịa