Gianni Infantino: Nwamadi a ga-eji ọgbọ na Fifa rue 2023
Akụkọ dị mkpa taa:
A họpụtala Infantino maka ọkwa onyeisi fifa ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Gianni Infantino enwetala ohere ichi agba nke abụọ ya dịka onyeisi otu egwuregwu mba ụwa bụ Fifa.
O nweghị ọnye zọsara Infantino ọkwa ahụ na ntuliaka e mere na Paris, isiobodo France.
Infantino onye weghaburu ọchịchị n'aka Sepp Blatter n'afọ 2016 ga-eji ọgbọ rue afọ 2023.
Ikuku ọjọọ na-egbu mmadụ nde asaa kwa afọ- WHO

Ebe foto si, Getty Images
Dika ụwa niile na-eme ncheta gburugburu taa bụ Wenezde, otu WHO ekwuola na nde mmadụ asaa na-anwụ kwa afọ site na ikuru ikuku adịghị mma.
Ha kwuru na mmadu itoolu n'ime iri na-ekuru ikuku adịghị mma.
Mmadụ 1618 nwụrụ na ọnwa atọ

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahazi njem okporoụzọ na Naijiria bụ FRSC ekwuola na opekata mpe mmadụ otu puku ,narị isi, iri na asatọ tufuru ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ site na ọnwa Disemba rue ọnwe anwa Febụwari afọ 2019.
Abuja enyeghi m vootu mana aga m echekwa ha - Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela ndị bi n'obodo Abuja nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ ịhụ na o chekwara ha agbanyeghi na ha atụnyereghị ya vootu.
Buhari kwuru nke a mgbe ụfọdụ n'ime ndị bi n'Abuja gara kpọtụrụ ya n'Aso Rock n'emume Sallah.
O kwuru na ọ ga-echekwa isi obodo ọchịchị Naịjirịa n'ihi na na ihe ọjọọ ọbụla mere ya ga-emetụta ya na ọchịchị ya.
N'okwu ya "Anaghị m eyi Abuja egwu maka ichekwa ya bụ ichekwa m nụ osote m, eche m na ha dị njọọ mere ha ji tụnyere PDP"
Ndị zuru ego Imo Steeti ga-agbọ ya - Ihedioha

Ebe foto si, Facebook/Ihedioha
Gọvanọ Imo Steeti bụ Emeka Ihedioha aṅụọla iyi kwuo na ọ ga-anapụta ego Steeti ahụ niile bụ nke ezuru ezu.
Ihedioha, onye kwuru nke a n'ọgbakọ idu ndị ụlọomeiwu steeti n'iyi ọrụ sị na ọ ga-eme nke a site n'enyemaka ndị ọrụ nchekwa dị iche iche.
Na Sudan

Ebe foto si, AFP
Ọnụọgụgụ ndị egburula n'ọgbaghara Sudan eruola iri isii n'ime ụbọchị abụọ dịka ndị dọkịnta si kwuo.
Ọgbaghara a malitere mgbe ndị ọrụ nchekwa ịgbanwe ọchịchị gbabara egbe n'etiti ndị gba aka ngwaọgụ na-eme ngagharịiwe.
N'egwuregwu

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
Otu Super Falcons nke Naịjirịa awụchiela na mba France maka asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị ga-ebiri ọkụ na Fradịde, bụ abalị asaa ọnwa Juun.
Ha ga-amalite asọmpi a mgbe ha ga-ezute mba Norway n'ụbọchị Satọde n'ime Otu Aa.













