Explosion in Cathedral: Ogbunigwe agbara n'ụlọụka Katolik n'Umuahia

Catholic Archdiocese nke Umuahia

Ebe foto si, Catholic Archdiocese Umuahia

Nkọwa foto, Mater Dei Catholic Cathedral, nke dị na Azikiwe Road n'Umuahia

Ụnyahụ bụ Tuzde ka akụkọ kọrọ na nnukwu ụda dị ka ogbunigwe dara na Catholic Archdiocese nke Umuahia a na-etu Mater Dei Catholic Cathedral, nke dị na Azikiwe Road n'Umuahia.

Agbanyeghị na ndị isi ya bụ ụlọụka jụru ịgwa onye ntaakụkọ BBC okwu, akwụkwọ akụkọ ndị ọzo kọrọ na ya bụ oke ụda gbara n'elekere abụọ na ụma nke ehihie.

Ụda ahụ mere ka ọtụtụ mmadụ nọ nso gbaa ọsọ ndụ ha chere na ọ bụ ogbunigwe dịka akwụkwọ News Agency of Nigeria si kọọ.

Ndị ha gbara ajụjụ ọnụ kwụrụ na ọ bụ tanki eji agba mmanụ ụgbọala nke e niri n'ala mgbe tereaka bụ ihe gbariri were mee ya bụ ụzụ dị egwu.

Ha sị na ihe mere ya bụ tanki jiri gbarie bụ maka ọkụ onye na-aza ihe ebe ahụ mụnyere n'elu ebe eliri ya bụ tanki bụ nke o ji gbaa ahịhịa ọkụ.

Ọ bụ uzuọkụ sị na ya bụ ọkụ mere ka ya bụ tanki gbarie.

Kọmishọna ndị uweojii na Abia steeti bụ Chris Eze gwara ndị ntaakụkọ na "ndị mgalaba ha ọkpọrọ Explosive Ordinance Department abalarị n'ọrụ ịma imi na ala mata ka ya hụ mmiri si banye opi ụgbọghịri.

Ọ kwere nkwa na mgbe adịghịanya na ndị mmadụ ga-amata nke bụ eziokwu.

Onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na onweghị onye meruru ahụ site na ya bụ oke ụda nke dara, agbanyeghị na ndị isi ụka ahụ jụru igosi ọha ebe ya bụ tanki gbariri.

Mana akwụkwọ akụkọ Punch dere na ya bụ ụda kwaturu mgbidi dị nso ma gbarikwa ụgbọla ndị mmadị ndị na nke agbataobi ha.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Nigeria Elections 2019: Buhari nwereike ida ntuliaka 2019