Ndi isi mba Afrịka abụọ ezerela ogbunigwe gbara na nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị
Ndị isiala mba Afịrịka abụọ zere ogbunigwe tata ka nzukọ ndọrọndọro ọchịchị Emmerson Mnangagwa gara yasara ka ogbunigwe gbara n'ebe ahụ ka aka nọ na-ekwu maka nke mere na isi obodo Etiopia bụ Addis Ababa ebe onyeisiala ha bụ Abiy Ahmed na ndi nkwado ya nọ na nzụkọ.
Ihe nkiri si Bulawayo na egosiri na ogbunigwe gbara na ọgbo egwuregwu akpọrọ "White City Stadium" ka Mnangagwa na-akwado ịhapụ ka ọ gwachara ndị nkwado ya okwu.
O merụhụ ahụ, mana osote onyeisiala Zimbabwe na ndi ọzọ ọkwa ha gbagotere n'ọchịchị Zimbabwe sọ na ndi merụrụ ahụ.
N'Etiopia, akuko ọhụru na-erụ anya nti na-akọwa na otu onye nwụrụ site na ogbunigwe a gbara.
Ndị ọrụ gọọmentị n'Itiopịa kwuru na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ka a tụrụ ogbunigwe ebe ndị na-akwado Abiy Ahmed, bụ onye ndọrọndọro ọchịchị, na-eme nzukọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ahmed kwuburu na ọtụtu mmadụ nwụrụ, ma kọwakwaa na ihe a mere bụ mkpamkpa apụtaghị ihe si n'aka "ndị na-achọghị ka Itiopịa dịrị n'otu".
A kpọpụrụ Abiy ozugbo ogbunigwe a gbara.
A na-eche na ogbunigwe siri n'ihe ndi Bekee kpọrọ "grenade" atụbara n'ime mmadụ puku na puku nọ n'ọgbọ Meskel nke dị n'isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa.
Aka ikenga Ahmed bụ Fitsum Arega, sị na mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ihe a mere, ebe nke mmadụ isii n'ime ha dị ezigbo njọ.
Abebaw Bekele, bụ onyeisi ndị otu gbatagbata Red Cross n'Addis Ababa, kwuru na ha ezipụla ụgbọala "Ambulance" 13 gawa ibute ndị ihe metụtara.

Ebe foto si, Reuters
Ha zigakwara ndị ọrụ gbatagbata 80 na ndị nọọsụ anọ.
Bekele kwuru na ozi ya nwetara kwuru na mmadụ 100 merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara.
Onyeisi oche ndị hazịrị nzụkọ a gwara BBC na anwụchịrị ndị mmadụ bu ogbunigwe n'ime akpa. Okwuru na ha nọ n'aka uweojii ugbua.
O kwukwara na ha na-eche na enwereike nwe ebe ọru ndi nchekwa siri gba ọrụ.
Na Zimbabwe, amabeghi mmadu ole merụru ahụ mana ndị ntaakụkọ na-akọwa na onwereike bụrụ na-etinyere ogbunigwe a n'okpuru ebe ndị nwere isi nọ.

Akụkọ ga-amasị gị:










