Atụọla Ogbunigwe n'ụlọ onye bụbụ osote onyeisiala Kenya

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii na mba Kenya kwuru na ngalaba ha na-ahụ maka ihe gbasara ogbunigwe awuchiela n'ụlọ onye bụbu osote onyeisiala Kenya bụ Kalonzo Musyoka dịka ndị omekome wakporo be ya tụa ogbunigwe ma gba egbe na ọnu ọzọ be ya.
Musyoka so na ndị otu pati na anọghị n'ochichi a na-akpọ Nasa (National Super Alliance).
Ihe a mere n'elekere abụọ nke ụtụtụ taa bụ Wenezde.
Ndị uweojii na akọwa na onyeghị onye meruru ahụ maọbụ nwụọ na ihe a mere, agbanyeghi na Kalonzo nọ n'ulọ.
Onye enyemeaka Kalonzo a kpọrọ Matiki na-akọwa na ndị kpara ike a ji ụgbọala bia, mana ha gbafere mgbe ha hụrụ na ndị nche nọ ọrụ n'ụlọ ahu.
"Ha tụghariri ka ha gbafere, kwụsị n'ọnụụzọ wee tụọ ogbunigwe ma bido igba egbe," ka Matiki siri kwuo.
Ogbuniwe ahụ ha tụrụ danyere na mgbidi wee dapụ n'okporo ụzọ tupu ọ gbaa.
Matiki sị na ndị mwakpo a gbara ọsọ ka ha kpachara ike a, ma kwukwa na ọ bụ ogbubu ka ha bịara igbu Kalonzo.
Ọ si na ha kpotere mgbọ egbe na ntu ogbunigwe ahụ iji gosi na mwakpo a mere.
Ndị uweojii gbajere ebe ihe a mere ka ha nwetere ozi.
Cunningham Suiyanka, bu onyeisi ndị uweojii na ebe ihe a mere si na ha ebidola nchọpụta.

Ebe foto si, Reuters
Kenya nọ na ọgbaaghara ugbua ka onye so we zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 bụ Raila Odinga chere onwe ya iyi ọrụ dịka "onyeisiala".
Kalonzo agaghị ebe Odinga mere mmeme iṅụ iyi a, mana tupu nke a eme, gọọmenti etiti mba Kenya wepụrụ ndị nche o nweburu dịka osote onyeisiala mba Kenya.
Kalonzo kwesiri ịnụ iyi ka osote Odinga.








