Hailemariam Desalegn: 'nke a bụ mbido mgbanwe' - Balcha

Akwa njiri mara ndị mba Ethopia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị anọghị n'ọchịchị na Ethiopia ekwuola uche ha maka Desalegn rirutu n'ọchịchị

Otu ndị anọghị n'ọchịchị na mba Ethiopia ekwuola na ọ bụ ngosipụta ndị Ethiopia chụturu Desalegn n'ọkwa ọchịchị.

Onyeisi ha nke a na-akpọ Getaneh Balcha sị na nke a bụ mbido mgbanwe ọnọdụ ala ha

Ọ kpọkwara ndị sọnyere n'ọchịchị ndịọzọ ha nere Desalegn anya ritukwa n'ọkwa ma nyeghachị ndị mmadụ ikike ị họta ndị ga-achị ha.

Ọ sịkwa ndị mmadụ ha jisike na-agba mbọ n'ihe ngosipụta ndị ha na-eme.

Desalegn ewkuola naọbụ maka iji kwado udo n'ezi ọchịchị n'ala ha ka oji tinye akwụkwọ arụkwaghịm taa.

Hailemariam Desalegn nke Ethiopia

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Ọbụ ndị ntaakụkọ onyonyo ka ọ bu ụzọ gwa ịhe a

Ọtụtụ ụlọ ndị ntaakụkọ nọ na mba Ethiopia ekwụpụtala na Desalegn tinyere akwụkwọ ahụ n'ụbọchị taa.

Desalegn ritu kwara n'ọkwa ọchịchị pati ya bụ People's Revolutionary Democratic Front.

Okwu nke a n'abịa ebe ndị mba ahụ bidoro n'ọtụtụ afọ gara aga ị gosipụta iwe ha n'aka gọọmentị ha.

N'ịhe ike nke mere n'izuụka a, ihe ruru mmadụ iri nwụrụ ebe ha na-egosi iwe ha.

Onye ntaakụkọ BBC nọ n'isi obodo Addis Ababa kwuru na ngosiputa ndị nke a na-aga n'iru n'agbanyeghị na Desalegn atọghepụla ọtụtụ ndị nọ ụlọ mkpọrọ.

Kedụ ịhe mba Ethiopia ji dị mkpa?

Kemgbe afọ 2015 ọtụtụ ndị anọghị n'ọchịchị na-eme ngosipụta iwe maka ọnọdụ ndọrondọrọ ọchichị na mpụ na-eme n'ala ha.

Nke bụtekwara nkewa n'etiti otu nọ n'ọkwa ọchichi ebe ọtụtụ ndị nnukwu mmadụ n'ahụ Desalegn ka onye aka esichaghị ike n'ọchịchị.

Ọ bụrụ na mba Ethiopia akwụsịghị ike, ọ ga ebụte obi ezụghike n'etịtị mba ndịọzọ nọ na mpaghara Afịrịka pụtara 'Horn of Africa' na bekee.