Police: Ihe anọ ntị nụrụ chie mana iwu amachighi ya

Nwoke na nwaanyị na-akpa nkata

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'agbanyeghị akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na ọ dịghị n'iwu, Kọmishọna ndị uweojii na Legọs bụ Edgal Imohimi ekwuola na iwu Naịjirịa machiri nwoke na nwaanyị idina onwe ha n'ọha.

Imohimi kwuru na o nwere ike ịkpọga gị nga afọ abụọ na ụma ma i mee otu a.

N'otu aka, Ebere Amaraizu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti kwunyere n'ihi Imohimi kwuru.

O siri na nwoke na nwaanyị iiri onwe ha n'ọha bụ ajọ ihe nke iwu megidere.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọbụla e jidere mere ụdị ahụ, ndị uweojii ga-anwụchị ya kpụbụ ya ụlọikpe.

Nke a bụ iji kwugharia ihe ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Abayomi Shogunle kwuru n'igwe okwu Twitter butere okwu.

N'ihihie Monde soshal midia nwuru ọkụ maka ọsịsa Shogunle nyere ajụjụ otu nwoke jụru ndị uweojii na Twitter.

Nwoke ahụ akara Twitter ya bụ @Stanley_Moses13 chọrọ ịma ma ndị uweojii enwere ike ijide nwoke na nwaanyị na-emekọ n'ihu ọha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Abayomi Shogunle sara ya sị na "nwoke na nwaanyị imekọ n'ime ụgbọala n'ọha anọghị n'iwu ma ọ bụrụ na ha toruola afọ 18, nakwa ebe ahụ abụghị ebe okpukpere cchi."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Dịka ụfọdụ na-akọtọ ya bụ okwu, ụfọdụ kwenyere n'ihe onye uweojii ahụ kwuru.

Ya mere BBC jiri banye ahịa ịmata nke bụ eziokwu n'aka ndị ọkaiwu.

Mmekọ nwoke na nwaanyị n'ọha

Onye mbụ anyị jụru bụ okaikpe Chukwuemeka Eze bụ onye sị na "agbanyeghị na-ọdịghị na Konstitushọn Naịjịịa ọ dịghị mma nwoke na nwaanyị ịmekọ na ọha." Ọ sị na bekee kpọrọ ya "indecent and immoral conduct".

Aha onyonyo, Police: Ihe anọ ntị nụrụ chie mana iwu amachighi ya

Ọ sị na ụdị agwa ahụ na-emebi anya ma bụrụ "ihe obodo na-asọ nsọ maọbụ n'iwu obodo maọbụ nke bekee".

Eze sị nakwa na ya bụ iwu dịkwa na nke bekee kpọro 'penal' maọbụ 'criminal code' nke dị na mpaghara ụfọdụ nke Naịjirịa.

Ọ sịkwa na ọ bụrụ na ndị ahụ gbara ọtọ kpam kpam bịa bụru ndị isi dị mma, na onye na-ekpe ya bụ ikpe kwesiri ịta ha ahụhụ nke ukwuu ruo ihe dịka afọ isii.

Okaiwu Patrick Okoro kwenyekwara Eze n'okwu ya.

Aha onyonyo, Police: Ihe anọ ntị nụrụ chie mana iwu amachighi ya

Okoro sịkwa na ụdị agwa ahụ bụ ihe bekee kpọrọ "Ponography" bụ nke omenala Igbo anabataghị.

Ọ sị na ụdị agwa a nwere ike ibute ọgbaghara na-ebe ụfọdụ nke bụ na ndị mmadụ nwere ike tụwa ha okwute.

Lee ihe ndị ọzọ gbasara okwu mekọrịta onye na onye iwu mabidoro:

Ikuchi nwaanyị

Ọkaikpe patrick Okoro kwenyesiri ike n'ikuchi nwaanyị bụ omenala Igbo dịwara gboo.

Okwuru na-agbanyeghị ka ndị mmadụ sị ahụta ya, na-onweghị ihe ndị njọ n'ime ya ma nke nwoke na nke nwaanyị kwekọrịta.

Ebe ọ nọ dị njọ bụ "ma ọ bụru na ha ekwkọrịtaghị".

Nwoke ịlụ nwaanyị abụọ maọbụ karịa

ụmunwoke ji aka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iwu Naịjirịa anabataghị mmekọ nwoke na nwoke

Chukwuemeka Eze sị na-enwere iwu abụọ na Naịjirịa, Iwu obodo na iwụ Naịjirịa.

Ọkwụrụ n'iwu obodo, na nwoke nwere ike ịlụ nwaanyị ole ọchọrọ.

Mana ọbụrụ na nwoke ahụ gbaa ụmụnwaanyị ndị ahụ akwụkwọ na "marriage registry" nke ndị na isiụọ ọrụ okpuruọchịchị ndị ahụ maọbụ na ụka, na nwoke ahụ adaala iwu akpọrọ "bigamy" nke nwere ike ịkpụga ya mkpọrọ.

Ọ sịkwa na-ọbụrụ n'ụka ka onye ahụ gbara akwụkwo na ahụ na ha nwere ike ịmachị ha.

Mana onye gbara akwụkwọ n'ụzọ omenala nwere ike ịlụ nwaanyị ole ọchọrọ.

Nwoke ịlụ nwoke maọbụ nwaanyị ịlụ ibe ya

ụmunwoke ji aka
Nkọwa foto, Iwu Naịjirịa anabataghị mmekọ nwoke na nwoke

Okaikpe Okoro kwuru na agbanyeghị ka ndị mba ọzọ si ahụta agwa nwoke maọbụ nwanyị ịlụ onwe ha, na iwu Naịjirịa na Iwu obodo megidere ya. Ọ sị na iwu Naịjirịa na ahụta ya bụ agwa ka arụ nke ndị ọbụla mere ya ga ewete onwe ha na mkpọro.

Akụkọ ga-amasị gị