Nigerian Senate: Ụlọomeiwu ajụla ịkwado ha ndị EFCC si n'aka Buhari
Akụkọ dị mkpa
Ụlọomeiwu ajụla aha onyeisiala zigaara ha

Ebe foto si, @NGRSenate
Ndị ụlọomeiwu ukwu ajụla ibinye aka n'aha mmadụ anọ bụ ndị onyeisiala Buhari họpụtara dịka ndị ndu ụlọọrụ EFCC.
Kọmiti ndị omeiwu na-ahụ maka nrụrụaka kwuru na o nweghị onye si na mpaghara ọwụwanyanwụ aha so na ndị ahụ.
Uweojii nwụchiri ndi okpukpere Juu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị okpukpere Jew dịka ha na-eme ngagharịiwe n' Umuahia, isi obodo, Abia steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Abia Steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo ndị otu Ipob kwunyere ndi okpukpere Juu na ngagharịiwe ahụ.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Ndị ndu mba Rọshịa na Amerịka na-agbarịta onwe ha egbe ọnụ n'ihi ụgbọelu ọgụ abụọ bu ngwaagha nuklịa nke mba Rọshịa fedatara na mba Venezuela.
Nke a na-egosi nkwado mba Rọshịa na-enye gọọmentị mba Venezuela nke onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwu Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na ịkpa oke dị n'ebe niile na ọ bụghị naanị na egwuregwu bọọlụ.
Ndị uweojii ka na-enyocha ikpa oke a kpasoro onye otu ya bụ Rahim Sterling.











