Bianca Ojukwu: Gwanụ Oye rituo n'ọkwa onyeisioche

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/ facebook
Ọnụ na-ekwuru ndị APGA n'Anambara steeti bụ Dan Nwafor ekwuola na APGA ga-akwado ihe ọbụla ga-eweghachi udo na pati ha.
Nwafor kwuru nke a na nzaghachi akụkọ pụtara nke kwuru na Bianca Ojukwu ekwenyela ikpe udo mana ọ gbara isi akwara na ọ bụ naanị ma onyeisioche pati ahụ bụ Victor Oye rituo n'ọkwa ya.
"Na Bianca Ojukwu nabatara ha gosiri n'okwu ahụ na-a ga-ekwute ya ihe.
" Ife ọbụla ga-eme ka APGA gaa n'ihu bụ ihe ga-adị anyị mma"
Ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati APGA gụnyere onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Jerry Chukwueke, onye omeiwu bụ Victor Umeh, John Gbor gara n'ụlọ Ojukwu dị n'Enugwu ịị nwunye ya bụ Bianca ka ọ gbaghara.
Obi adịghị Bianca mma kemgbe APGA mechara ntuliaka imeụlọ pati ahụ ebe ọ zọrọ ikike ịnọchị Anambra South n'ụlọomeiwu ukwu na aha APGA nke Nicholas Ukachukwu meriri na ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:




